Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 3:6 - Bible Nso

6 Solomon we si, Gi onwe-gi emeworo orù-Gi, bú Devid nnam, ebere uku, dika o jere ije n'iru Gi n'ezi-okwu na n'ezi omume, na nime obi ziri ezi n'ebe I nọ; I we debere ya ebere uku a, nye ya nwa-nwoke nke nānọkwasi n'oche-eze-ya, dika ọ di ta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Solomọn zara sị, “I gosila ohu gị bụ nna m Devid obi ebere dị ukwuu, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi nye gị, onye ezi omume nakwa onye obi ya ziri ezi. Ị nọgidela na-egosi ya obi ebere dị ukwuu, nyekwa ya nwa nwoke ga-anọkwasị nʼocheeze ya nʼụbọchị taa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 3:6
24 Iomraidhean Croise  

Ọ sim, Jehova, Onye m'jeghariworo n'iru Ya, gēziga mọ-ozi-Ya ka gi na ya yikọ je, Ọ gēme kwa ka ije-gi ga nke-ọma; i gāluta-kwa-ra nwam nwunye sitere n'ab͕urum, na n'ulo nnam:


Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di: Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ.


Jehova we meghachim dika ezi omumem si di; Dika idi-ọcham n'anya-Ya si di.


Je, si orùm, bú Devid, Otú a ka Jehova siri, Ọ̀ bu gi onwe gi gēwurum ulo ibu ebe M'gēbi?


Ọzọ kwa, otú a ka eze siri, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye nyeworom ta onye nānọkwasi n'oche-ezem, anyam nāhu kwa ya.


n'ihi na Devid mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, o sighi kwa n'ihe ọ bula O nyere ya n'iwu wezuga onwe-ya ubọchi nile nke ndu-ya, ọ bu nání n'okwu Uraia onye Het.


ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike nke O kwuru bayerem, si, Ọ buru na umu-gi elezie uzọ-ha anya, ijeghari n'irum n'ezi-okwu n'obi-ha nile na na nkpuru-obi-ha nile, agaghi-ebipu n'ulo-gi onye nwe inọdu n'oche-eze Israel, ka O kwuru.


Ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu dika nna-gi, bú Devid, jere, M'gēme kwa ka ubọchi-gi di ogologo.


Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n'irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, n'izu-okè nke obi, na n'izi-ezi, ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile;


Biko, Jehova, biko, cheta otú m'jeghariworo n'iru Gi n'ezi-okwu na n'obi zuru okè, ọ bu kwa ihe di nma n'anya-Gi ka m'meworo. Hezekaia we kwa ákwá nke-uku.


Solomon we si Chineke, Gi onwe-gi emeworo Devid nnam ebere uku, I we mem eze n'ọnọdu ya.


Nkpuru-obim, laghachi n'ebe-izu-ike-gi; N'ihi na Jehova emesowo gi nke-ọma.


Meso orù-Gi nke-ọma, ka m'we di ndu; M'gēdebe kwa okwu-Gi.


Ka m'bùkue Jehova abù, N'ihi na Ọ mesowom nke-ọma.


Onye nēje ije n'izu-okè, nke nālu kwa ọlu ezi omume, Nke nēkwu kwa ezi-okwu n'obi-ya.


Ọ bughi otú a ka orùm Moses di; n'ulom nile onye kwesiri ntukwasi-obi ka ọ bu


ebe anēme ka unu buru ọgaranya n'ihe nile ọ bula rue afọ-ofufo nile, nke sitere n'aka-ayi nāluputa ekele anēkele Chineke.


Ya mere agurughi m na ọ di nkpà iriọ umu-nna-ayi, ka ha buru uzọ jekuru unu, buru kwa uzọ me ka ihe-ngọzi ahu nke unu buru uzọ kwe na nkwa zu okè, ka ihe ahu we buru ihe edoziri, dika ihe-ngọzi, ọ bughi kwa dika ihe-nrib͕u.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan