Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 3:4 - Bible Nso

4 Eze we jerue Gibeon ichu àjà n'ebe ahu; n'ihi na nke ahu bu oké ebe di elu: nnù àjà-nsure-ọku abua na ọgu iri ka Solomon surere n'elu ebe-ichu-àjà ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Eze gara Gibiọn nʼihi ịchụ aja, nʼihi na ebe ahụ bụ ebe kachasị mkpa, dị elu. Solomọn chụrụ otu puku aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 3:4
18 Iomraidhean Croise  

Ha we bugota ib͕e Jehova, na ulo-ikwū nzute, na ihe nsọ nile nke di n'Ulo-ikwū ahu; ndi-nchu-àjà na ndi Livai we bugota ha.


Solomon we chua ihe àjà nke àjà-udo nke ọ churu nye Jehova, bú orú nnù ehi uzọ abua na nnù iri-na-ise, na orú nnù aturu uzọ iri-na-ise. Eze na umu Israel nile we ra ulo Jehova nye Chineke.


na Jehova mere ka Solomon hu Ya anya nke ub͕ò abua, dika O mere ka ọ hu Ya anya na Gibeon.


na Zedok, bú onye-nchu-àjà, na umu-nne-ya, bú ndi-nchu-àjà, n'iru ebe-obibi Jehova n'ebe di elu nke di na Gibeon,


Ma ebe-obibi Jehova, nke Moses mere n'ọzara, na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, di n'ebe di elu nime Gibeon na mb͕e ahu.


Solomon we gwa Israel nile okwu, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na nke usu nile nke ọgu ndikom ise, na ndi-ikpe, na onye-isi ọ bula nke Israel nile, bú ndi-isi ulo nke ndi bu nna.


Solomon, ya na nkpọkọta ahu nile, we jerue ebe di elu nke di na Gibeon; n'ihi na n'ebe ahu ka ulo-ikwū nzute nke Chineke di, bú nke Moses, bú orù Jehova, mere n'ọzara.


N'ihi na Hezekaia, bú eze Juda, buliri nye nkpọkọta ahu nnù oke-ehi abua na ọgu iri, na nnù aturu iri-na-asa na ọgu iri; ndi-isi buli-kwa-ra nye nkpọkọta ahu nnù oke ēhi abua na ọgu iri, na orú nnù aturu na nnù ise: ndi-nchu-àjà we do onwe-ha nsọ n'uba.


Eze, bú Solomon, we chua àjà, bú orú nnù ehi uzọ abua na nnù iri-na-ise, na orú nnù aturu uzọ iri-na-ise. Eze na ndi Israel nile we ra ulo Chineke nye Chineke.


Lebanon ezughi kwa isure ọku, anu-ọhia-ya ezughi kwa isure àjà-nsure-ọku.


O rue, n'arọ ahu, na nmalite ọbubu-eze Zedekaia, bú eze Juda, n'arọ nke-anọ, n'ọnwa nke-ise, na Hananaia nwa Azua, bú onye-amuma, nke sitere na Gibeon, gwaram okwu n'ulo Jehova, n'anya ndi-nchu-àjà na ndi Israel nile, si,


o rue, mb͕e ha nuru ya, na ha turu egwu nke-uku, n'ihi na Gibeon bu obodo uku, dika otù nime obodo ala-eze ahu, na n'ihi na ọ di uku kari Ai, ndikom-ya nile bu kwa ndi-dike.


Ma obodo ebo umu Benjamin nwere dika ab͕uru nile ha si di bu Jeriko, na Bet-họgla, na Emek-keziz;


Ma ndi bi na Gibeon nuru ihe nke Joshua mereri Jeriko me kwa Ai,


Sọl we si, Wetaram àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile nso. O we sure àjà-nsure-ọku ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan