1 Ndị Eze 22:8 - Bible Nso8 Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n'aka-ya, bú Maikaia nwa Imla: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n'ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a8 Eze Izrel zaghachiri Jehoshafat, sị, “A ka nwere otu onye amụma, onye anyị nwere ike isite nʼaka ya jụọ Onyenwe anyị ase, ọ bụ Maikaya nwa Imla, ma akpọrọ m ya asị, nʼihi na o nweghị oge ọ na-ebu amụma ihe ọma nʼebe m nọ, kama ọ bụ naanị nke ọjọọ.” Jehoshafat sịrị, “Eze ekwesighị ikwu okwu dị otu a.” Faic an caibideil |