Ma Solomon huru Jehova n'anya, nēje ije n'ukpuru nile nke Devid, bú nna-ya: ọ bu nání na ya onwe-ya nāchu àjà, nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu.
Jihu nwa Hanani, bú onye-ọhu-uzọ, we pua izute ya, ọ si eze, bú Jehoshafat, Ò kwesiri gi iyere onye nēmebi iwu aka? ọ̀ bu kwa ndi nākpọ Jehova asì ka i nāhu n'anya? ma n'ihi ihe a iwe dikwasi gi site n'iru Jehova.
ajọ omume nile nke unu na ajọ omume nile nke ndi bu nna-unu n'otù, ka Jehova siri, bú ndi sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ugwu nile, takwam uta n'elu ugwu ntà nile: M'gēbu kwa uzọ tùa ọlu-ha n'obi-ha.
Unu na ndi nēkweghi ekwe ekekọtala onwe-unu, n'ihi na unu na ha di iche: n'ihi na òle nkekọ ezi omume na imebi-iwu nēkekọ? ma-ọbu òle nnwekọ ìhè na ọchichiri nēnwekọ?