1 Ndị Eze 22:43 - Bible Nso43 O jere ije n'uzọ Esa, bú nna-ya; o sighi nime ya wezuga onwe-ya, nēme ihe ziri ezi n'anya Jehova: nání na ewezugaghi ebe di elu; ndi Israel nọ nāchu àjà nēsure kwa ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ebe di elu nile. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a43 Nʼihe niile o jere ije nʼụzọ Asa bụ nna ya, o sitekwaghị nʼime ha wezuga onwe ya, o mekwara ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. Naanị na o wezugaghị ebe dị elu niile, nke mere na ndị mmadụ gara nʼihu na-achụ aja, na-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼebe ahụ niile. Faic an caibideil |
Esa we kpọkue Jehova, bú Chineke-ya, si, Jehova, Ọ dighi onye tiyere Gi iye aka, n'etiti onye bara uba na onye ike nādigh: yere ayi aka, Jehova, bú Chineke-ayi; n'ihi na ọ bu na Gi ka ayi dabere, ọ bu kwa n'aha-Gi ka ayi biaworo imegide ìgwè a. Jehova, Chineke-ayi ka I bu; ekwela ka ihe akpọrọ madu b͕ochigide Gi.