Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 22:40 - Bible Nso

40 Ehab we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; Ehazaia, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

40 Ehab sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ. Ahazaya nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 22:40
13 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ubọchi-gi zuru, mb͕e gi gēsoro nna-gi-hà dina kwa n'ọnwu, M'gēme kwa ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, nke gēsi n'afọ-gi puta, M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.


Ma Hedad nuru n'Ijipt na Devid soro nna-ya-hà dina n'ọnwu, na Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, anwuwo kwa, Hedad we si Fero, Zilagam, ka m'we la n'alam.


Solomon we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid, bú nna-ya: Rehoboam, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.


Rehoboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid: aha nne-ya bu Neama, bú nwayi Amon. Abaijam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu-ya.


Devid we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid.


Ma okwu Ehab nile nke fọduru, na ihe nile ọ mere, na ulo ọdu nke o wuru, na obodo nile nke o wuru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?


Jehoshafat nwa Esa malitere ibu eze Juda n'arọ nke-anọ nke Ehab, bú eze Israel.


Ehazaia nwa Ehab malitere ibu eze Israel nime Sameria n'arọ nke-iri-na-asa nke Jehoshafat, bú eze Juda, o we buru eze Israel arọ abua.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je kwa ije n'uzọ nna-ya, na n'uzọ nne-ya, na n'uzọ Jeroboam nwa Nebat, nke o ji me ka Israel mehie.


O we nwua, dika okwu Jehova si di nke Elaija kwuru. Jehoram we malite ibu eze n'ọnọdu ya n'arọ nke-abua nke Jehoram nwa Jehoshafat, bú eze Juda; n'ihi na o nweghi nwa-nwoke.


Ehazaia we dapu n'ihe-ọkpukpa window nke ime-ulo-elu-ya nke di na Sameria, o we ria ọria: o ziga ndi-ozi, si ha, Jenu, jua Beal-zebub, bú chi Ekron, ase ma m'gādiri ndu n'ọria nka.


Ma mb͕e ihe ndia gasiri, Jehoshafat, bú eze Juda, jikọrọ onwe-ya na Ehazaia, bú eze Israel; onye ahu nēmebi iwu n'omume-ya:


Jehova we si Moses, Le, gi na nna-gi-hà ganēdina; ndi nka gēbili kwa, soro chi ala ọzọ nile nke ala ahu kwa iko, bú ebe ha onwe-ha nābà n'etiti ya, ha gārapukwam, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum nke Mu nà ha b͕ara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan