Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 22:23 - Bible Nso

23 Ma ub͕u a, le, Jehova etiyewo mọ okwu-ugha n'ọnu ndi-amuma-gi ndia nile; Jehova ekwuwo kwa ihe ọjọ bayere gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 “Ma ugbu a, Onyenwe anyị etinyela mmụọ okwu ụgha nʼọnụ ndị amụma gị niile ndị a. Onyenwe anyị ekwubiela nʼihe ọjọọ ga-adakwasị gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 22:23
19 Iomraidhean Croise  

Ọ si ya, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i zilagawo nwoke ahu ka ọ pua n'aka-gi, bú onye M'wezugara ka ebibie ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ndi-gi gāla-kwa-ra ndi-ya.


Ma i gāgwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ì b͕uwo ọchu, nweta kwa? I gāgwa kwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ebe nkita rachara ọbara Nebot ka nkita gāracha ọbara-gi, ọbuná nke gi onwe-gi.


Zedekaia nwa Keneana we biarue nso, tie Maikaia aka na ǹtì, si, Òle uzọ Mọ Jehova siri n'ebe m'nọ gabiga igwa gi okwu?


O rue, mb͕e ọ nāgwa ya okwu, na eze siri ya, Ọ̀ bu iburu eze onye nādu ọdu ka ayi meworo gi? ra aka; n'ìhi gini ka agētib͕u gi? Onye-amuma ahu we ra aka, si, Amawom na Chineke ezubewo ibibi gi, n'ihi na i mewo nka, i geghi kwa idu-ọdum nti.


Ma Jehova mere ka obi Fero di ike, o zipughi kwa umu Israel.


Jehova we si Moses, Mb͕e i je ilaghachi n'Ijipt, le anya ka i me n'iru Fero ihe-ebube nile nke M'tiyere n'aka-gi: ma Mu onwem gēme ka obi-ya di ike, ọ gaghi-ezipu kwa ndim.


Ahuhu gādiri onye nēmebi iwu! ọ gādiri ya njọ: n'ihi na nmeso aka-ya abua mesoro madu ka agēme ya.


Ọ bu onye ji ntu azù onwe-ya: obi akwara emò ewezugawo ya, o we ghara inaputa nkpuru-obi-ya, ma ọbu isi, Ọ̀ bughi okwu-ugha, bú ihe di n'aka-nrim?


Ma ub͕u a, biko, gwa ndi Juda, gwa kwa ndi bi na Jerusalem, okwu, si, Otú a ka Jehova siri: Le, Mu onwem nākpu ihe ọjọ megide unu, nēchè kwa èchìchè megide unu: biko, sinu, onye ọ bula n'uzọ ọjọ ya, lata, me kwa ka uzọ nile unu na omume nile unu di nma.


Ma onye-amuma ahu, mb͕e agārafu ya, o we kwue okwu, Mu onwem, bú Jehova, arafuwo onye-amuma ahu, M'gēsetipu kwa akam n'aru ya, kpochapu ya n'etiti ndim, bú Israel.


Ọ buru na Belak enyem ojuju ulo-ya nke ọla-ọcha na ọla-edo, apughm igabiga okwu-ọnu Jehova, ime ezi ihe ma-ọbu ihe ọjọ site n'obi nke akam, ihe nke Jehova gēkwu, nke ahu ka m'gēkwu?


Ma Saihon, bú eze Heshbon, achọghi ka ayi gabiga n'ala-ya: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, mere mọ-ya ka ọ di ike, b͕a kwa obi-ya ume, ka O we nye ya n'aka-gi, otú ọ di ta.


Chinek we zite mọ ọjọ n'etiti Abimelek na ndi-nwe Shekem; ndi-nwe Shekem we ghọb͕ue Abimelek:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan