Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 22:19 - Bible Nso

19 Ọ si, N'ihi nka nuru okwu Jehova: ahurum Jehova ka Ọ nānọkwasi n'oche-eze-Ya, na usu-ndi-agha nke elu-igwe nile ka ha nēguzo n'akuku Ya n'aka-nri-Ya na n'aka-ekpe-Ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Mikaya gara nʼihu, sị, “Ya mere, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị. Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ nọkwasịrị nʼocheeze ya, hụkwa usuu nke eluigwe ka ha na-eguzo nʼakụkụ ya, nʼaka nri ya nakwa nʼaka ekpe ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 22:19
30 Iomraidhean Croise  

Jehova we si, Ònye gārafu Ehab, ka o we rigo, da na Remot-gilead? Ọtù onye we si otú a; onye ọzọ si-kwa-ra otú a.


Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha.


Ubọchi we di na umu Chineke biara iguzo onwe-ha n'iru Jehova, Setan we bia kwa n'etiti ha iguzo onwe-ya n'iru Jehova.


Ọ dighi chi ala ọzọ gādi nime gi; I gaghi-akpọ kwa isi ala nye chi mba ọzọ.


ha we hu Chineke nke Israel; ma n'okpuru ukwu-Ya abua ọ di ka pavement eji nkume sapphire me, ọ di kwa ka elu-igwe onwe-ya n'idi-ọcha.


Moses we rigo, ya na Eron na Nedab na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye nke Israel:


Nurunu okwu Jehova, unu ndi-ikpe Sọdọm; ṅanu nti n'iwu Chineke-ayi, unu ndi Gọmọra.


N'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi nākwa emò, ndi nāchi ndi nka bi na Jerusalem:


Nurunu okwu Jehova, unu ulo Jekob, na ab͕uru nile nke ulo Israel:


Ma unu onwe-unu, nurunu okwu Jehova, unu ndi nile emere ka unu je biri n'ala ọzọ, ndi M'zigara si na Jerusalem rue Babilon.


ma ub͕u a n'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi Juda fọduru: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Ọ buru na unu onwe-unu edosie iru-unu ike ibà n'Ijipt, unu ewe ba inọ dika ọbìa n'ebe ahu;


Nwa nke madu, bue amuma megide ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma, gi si ndi nēbu amuma si n'obi-ha puta, Nurunu okwu Jehova;


N'ihi nka, gi nwanyi nākwa iko, nuru okwu Jehova:


Ma ub͕u a nuru okwu Jehova: Gi onwe-gi nāsi, Ebula amuma megide Israel, abusa-kwa-la okwu-gi dika miri-ozuzo megide ulo Aisak:


Onye ahu nke nēguzo n'etiti osisi myrtle we za, si, Ndia bu ndi Jehova ziteworo ijeghari n'uwa.


Ọ we tua ilu-ya, si, Ihe nke si n'ọnu Belam nwa Beoa puta, Bú ihe nke si n'ọnu nwoke ahu puta, onye anya-ya mechiri emechi:


Lezienu anya ka unu ghara ilelì otù nime ndi ntà ndia anya; n'ihi na asim unu, na mb͕e nile ndi-mọ-ozi-ha n'elu-igwe nēlegide iru Nnam Nke bi n'elu-igwe.


Ma mb͕e ọ bula Nwa nke madu gābia n'ebube-Ya, Ya na ndi-mọ-ozi nile, mb͕e ahu ka Ọ gānọkwasi n'oche-eze nke ebube-Ya:


Hà nile abughi ndi-mọ nēfè òfùfè, ndi eziputara ije ozi n'ihi ndi gaje iketa nzọputa?


Ọ nēkwu kwa ihe bayere ndi-mọ-ozi, si, Onye nēme ndi-mọ-ozi-Ya ka ha buru ifufe, Nēme kwa ndi nējere Ya ozi ka ha buru ọku nēnwu enwu:


kama unu abiaruwo ugwu Zaion, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n'elu-igwe, na ọtutu ndi anāpughi iguta ọnu,


M'we hu, nu kwa olu ọtutu ndi-mọ-ozi ndi nọ oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu gburugburu; ọnu-ọgugu-ha riri oké nne nke-uku, nke anāpughi iguta ha;


Ma Mọ nke Jehova wezugara Onwe-ya n'ebe Sọl nọ, mọ ọjọ we si n'ebe Jehova nọ me ka ọ tua egwu nke-uku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan