Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 22:16 - Bible Nso

16 Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n'aha Jehova?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Eze sịrị ya, “Ugboro ole ka m ga-eme ka ị ṅụọ iyi na ị gaghị agwa m ihe ọzọ, karịa naanị eziokwu nʼaha Onyenwe anyị?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 22:16
14 Iomraidhean Croise  

O we biakute eze. Eze we si ya, Maikaia, àyi gējeru Remot-gilead ibu agha, ma-ọbu àyi gārapu? Ọ si ya, Rigo, ka ihe ga-kwa-ra gi nke-ọma; Jehova enyewo kwa ya n'aka eze.


Ọ si, Ahurum Israel nile ka ha b͕asaworo n'ugwu, dika ìgwè aturu nēnweghi onye-ọzùzù: Jehova we si, Ọ dighi onye nwe ndia; ka ha laghachi, nwoke ọ bula n'ulo-ya n'udo.


Eze we si ya, Ùb͕ò ole ka mu onwem ganāb͕a gi iyi ka i ghara igwam ihe ọ bula ma-ọbughi ezi-okwu n'aha Jehova?


Onye-amuma nke nrọ di ya n'ọnu, ya ze nrọ-ya; ọzọ, onye ahu okwum di ya n'ọnu, ya kwue okwum n'ezi-okwu. Gini ka okporo-ọka na ọka wheat nwekọrọ? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n'ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N'aka eze Babilon ka agēnye gi.


Eze, bú Zedekaia, we ziga, kutara onwe-ya Jeremaia, bú onye-amuma, rue nbata nke-atọ nke di n'ulo Jehova: eze we si Jeremaia, Mu onwem gaje iju gi otù ihe; ezonarilam ihe ọ bula.


Belam we si Belak, abiakutewom i: ub͕u a ọ̀ di ike ọ bula m'nwere ikwu ihe ọ bula? okwu ahu nke Chineke gētiye n'ọnum, nke ahu ka m'gēkwu.


Ma Jisus kpuchiri ọnu. Onye-isi-nchu-àjà we si Ya, Ewerem Chineke di ndu b͕a Gi iyí, ka I gwa ayi ma Gi onwe-gi bu Kraist ahu, Ọkpara Chineke.


mb͕e o tisiri nkpu n'oké olu, o we si, Gini ka mu na Gi nwekọrọ, Jisus, Ọkpara Chineke Nke kachasi ihe nile elu? Ewerem Chineke b͕a Gi iyi, emekpalam aru.


Ma ufọdu nime ndi-Ju ndi nējeghari, bú ndi si na ha nāchupu ndi ajọ mọ, tiye-kwa-ra-aka-ha ikpọkwasi aha Onye-nwe-ayi Jisus n'isi ndi nwere ajọ mọ ahu, nāsi, Ewerem Jisus Onye Pọl nēkwusa b͕a unu iyi.


Joshua we b͕a ha iyi na mb͕e ahu, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu n'iru Jehova, nke gēbili wue obodo Jeriko a: ọkpara-ya ka ọ gēwere tọ ntọ-ala-ya, nwa-nwoke-ya nke-ntà ka ọ gēwere kwa guzo ọnu-uzọ-ama-ya ọtọ.


Ma achiri ndikom Israel n'ihe-ike ubọchi ahu: Sọl we b͕a ndi Israel iyi, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri rue anyasi, ru kwa mb͕e m'bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom. Ndi Israel nile we ghara idetu nri ọnu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan