Ben-hedad we si ya, Obodo nile nke nnam nara n'aka nna-gi, m'gēnyeghachi gi ha; i gākwa-kwa-ra onwe-gi amá nime Damaskọs, dika nnam kwara nime Sameria. Ma mu onwem, ka Ehab kwuru, n'ọb͕ub͕a-ndu nka ka m'gēzilaga gi. Ya na ya we b͕a ndu, o we zilaga ya.
Ì huwo na Ehab ewedawo onwe-ya n'ala n'irum? n'ihi na o wedawo onwe-ya n'ala n'irum, M'gaghi-eme ka ihe ọjọ ahu bia n'ubọchi-ya: ọ bu n'ubọchi nwa-ya ka M'gēme ka ihe ọjọ ahu biakwasi ulo-ya.