Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 21:8 - Bible Nso

8 O we de akwukwọ n'aha Ehab, were nb͕a-aka-akàrà-ya ka ha, zigara ndi-okenye akwukwọ ahu, ziga-kwa-ra ndi amara aha-ha ndi nọ n'obodo-ya, ndi ha na Nebot bi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ya mere, Jezebel dere akwụkwọ nʼaha Ehab, were mgbaaka akara eze kaa nʼakwụkwọ ndị ahụ, zigara ha ndị okenye obodo na ndị a na-asọpụrụ bi nʼobodo ebe Nebọt bi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 21:8
18 Iomraidhean Croise  

Eze Israel we kpọ ndi-okenye nile nke ala, si, Biko, maranu, hu kwa, na ọ bu ihe ọjọ ka nwoke a nāchọ: n'ihi na o ziterem ozi ichinye ya ndinyom nkem, na ichinye ya umum, na inye ya ọla-ọcham, na inye ya ọla-edom; ma eb͕ochighm ha n'aka-ya.


O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na Nebot, bú onye Jezreel, nwere ubi-vine, nke di na Jezreel, n'akuku ulo uku Ehab, bú eze Sameria.


O we de n'akwukwọ ahu, si, Kpọsanu obu-bu-ọnu, me ka Nebot nọdu n'isi ọnọdu n'etiti ndi Israel:


Jihu we tib͕ue ndi nile fọduru ulo Ehab nime Jezreel, na ndi uku ya nile, na ndi ọ mara nke-ọma, na ndi-nchu-àjà-ya, rue mb͕e ọ dighi onye fọduru ọ rapuru ya.


Ọ de-kwa-ra akwukwọ, ita Jehova, bú Chineke Israel, uta, na ikwu okwu megide Ya, si, Dika chi mba nile nke ala ọzọ nile, ndi nānaputaghi ndi-ha n'akam, otú a Chineke Hezekaia agaghi-anaputa ndi-ya n'akam.


Nka bu ndeputa edeputara n'akukwọ-ozi ahu nke ha zigara ya, bú Ataksakses, bú eze; Ndi-orù-gi, bú ndikom n'ofè osimiri, na ihe ọzọ di otú a.


Sanbalat we ziterem onye nējere ya ozi nke ub͕ò ise dika okwu a si di, ya na akwukwọ-ozi nke emegheworo n'aka-ya;


Jehova we si Moses, Chikọtaram ọgu ndikom atọ na iri sitere na ndi-okenye Israel, ndi i maworo na ha onwe-ha bu ndi-okenye nke ndi Israel, na ndi nēle ha anya n'ọlu: gi chiri ha bia rue ulo-ikwū nzute, ka ha we soro gi guzo onwe-ha n'ebe ahu.


Ha we ga, mechie ílì ahu si-ike, n'ika akàrà na nkume ahu, ha na òtù ndi-nche ahu yikọrọ.


Ndi nile ndi nọ n>ọnu-uzọ-ama na ndi-okenye we si, Ndi-#am#a ka ayi bu. Jehova me nwayi a nke n=ab#a n>ulo-gi ka ọ di ka Rechel na dika Lea, ndi ha abua wuru ulo Israel: gi me kwa d#inkp#a n>Efrata, me ka amara aha-gi na Bet-lehem:


O we chiri ndikom iri sitere na ndi-okenye obodo, si, Nọdunu ala n>ebe a. Ha we nọdu ala.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan