Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 21:27 - Bible Nso

27 O rue, mb͕e Ehab nuru okwu ndia, na ọ dọwara uwe-ya nile, tukwasi ákwà-nkpe n'anu-aru-ya, bue ọnu, dina n'ákwà-nkpe, jegharia nwayọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Mgbe Ehab nụrụ okwu amụma ndị a, ọ dọwara uwe ya, yikwasị onwe ya akwa mkpe, buo ọnụ, dinaa nʼakwa mkpe ahụ, jegharịakwa nʼịdị umeala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 21:27
18 Iomraidhean Croise  

Jekob we dọwa uwe-nb͕okwasi-ya nile, yiri ákwà-nkpe n'úkwù-ya, ruru nwa-ya újú ọtutu ubọchi.


Devid we si Joab, si kwa ndi nile ya na ha nọ, Dọwanu uwe-unu, ke ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tie aka n'obi n'iru Abnea. Eze, bú Devid, nējeso kwa ihe eji ebu ozu.


Okwu Jehova we rue Elaija, bú onye Tisbe, nti, si,


Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ, na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.


O rue, mb͕e eze, bú Hezakaia, nuru ya, na ọ dọwara uwe-ya nile, were ákwà-nkpe kpuchie onwe-ya, ba n'ulo Jehova.


O rue, mb͕e eze nuru okwu nile nke nwayi ahu, na ọ dọwara uwe-ya nile; (ma ya onwe-ya nāgabiga n'elu mb͕idi;) ndi Israel we le anya, ma, le, ákwà-nkpe dikwasi n'anu-aru-ya n'okpuru uwe-ya.


Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n'etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n'aka-ya, nke esetiri n'elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n'ala.


Ákwà-nkpe ka m'dukọtaworo n'elu akpukpọ-arum, Turughari mpim n'ájá.


Ndi Israel we nu okwu ọjọ a, ha we rue újú: ọ dighi kwa onye ọ bula tiyere ihe-ichọ-nma-ya n'aru ya.


Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, we kpọsa ikwa ákwá, na iti aka n'obi n'újú, na ime isi-nkwọcha, na ike ákwà-nkpe n'úkwù n'ubọchi ahu:


Gini ka m'gēkwu? Ọ gwaram okwu, Ya onwe-ya me-kwa-ra ya: M'ganēje nwayọ arọm nile n'ihi idi-ilu nke nkpuru-obim.


Ma ha atughi oké egwu, ha adọwaghi kwa uwe-ha, bú eze na ndi-orù-ya nile ndi nānu okwu ndia nile.


Kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, ti-kwa-nu aka n'obi, unu ndi-nchu-àjà; kwasienu ákwá ike, unu ndi-oje-ozi nke ebe-ichu-àjà; bianu, nọ ọnọdu-abali n'ákwà-nkpe, unu ndi nējere Chinekem ozi: n'ihi na eb͕ochiwo onyinye-inata-iru-ọma na àjà-ihe-ọṅuṅu n'ulo Chineke-unu.


Chineke we hu ọlu nile ha, na ha siri n'uzọ ọjọ ha chigharia; Chineke we chègharia uche bayere ihe ọjọ ahu, nke O kwuru, si na Ọ gēme ha; O meghi kwa ya.


Okwu ahu we rute eze Nineve aru, ọ we si n'oche-eze-ya bilie, yipu uwe-nwuda-ya n'aru ya, kpuchie onwe-ya n'ákwà-nkpe, nọkwasi na ntu.


M'gēnye kwa ndi-àmàm abua ike, ha gēbu kwa amuma nnù ubọchi atọ na ọgu atọ, eb͕okwasiwo kwa ha ákwà-nkpe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan