Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 21:21 - Bible Nso

21 Le, M'nēme ka ihe ọjọ bakute gi, M'gēkpochapu ndi-gi fọduru, M'gēbipu kwa n'aru Ehab nwa-nwoke ọ bula, na onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel, ka Jehova kwuru:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ọ sịrị, ‘Aga m eme ka ihe ọjọọ dakwasị gị. Aga m ekpochapụ ndị agbụrụ gị, site nʼezinaụlọ Ehab bipụ nwoke ọbụla, maọbụ ohu maọbụ onyenwe onwe ya nʼIzrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 21:21
15 Iomraidhean Croise  

n'ihi nka, le, M'nēme ka ihe ọjọ biakute ulo Jeroboam, M'gēbipu kwa n'aru Jeroboam nwa-nwoke ọ bula, onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel, M'gēkpochapu kwa nke fọduru nke ulo Jeroboam, dika madu si ekpochapu ǹsí-anu, rue mb͕e agēkpochapuzu ya.


n'ihi nmehie nile nke Jeroboam nke o mehiere, na nke o ji me ka Israel mehie; nime nkpasu-iwe-ya nke o ji kpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe.


le, M'nēkpochapu nke fọduru nke Beasha, bú nke fọduru nke ulo-ya; M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam, bú nwa Nebat.


Ọ biarue Sameria, tib͕ue ndi nile fọduru Ehab nime Sameria, rue mb͕e o kpochapuru ya, dika okwu Jehova si di, nke Ọ gwara Elaija.


Jehova we si Jihu, N'ihi na i mewo nke-ọma n'ime ihe ziri ezi n'anyam, i we me ulo Ehab dika ihe nile si di nke di n'obim, umu-gi ndikom nke umu-umu nke-anọ gānọkwasiri gi n'oche-eze Israel.


N'ihi na Jehova huru nweda-n'ala nke Israel, na ọ di ilu nke-uku: ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọdu onye arapuru fọduru, ọ dighi kwa onye-iye-aka ọ bula Israel nwere.


M'gēseti kwa n'elu Jerusalem eriri Sameria na ihe-ọtùtù ulo Ehab: M'gēhicha kwa Jerusalem dika madu si ehicha ọkwa, nēhicha ya, nēkpùta ya iru.


Ahuhu gādiri onye nēmebi iwu! ọ gādiri ya njọ: n'ihi na nmeso aka-ya abua mesoro madu ka agēme ya.


N'ihi na Jehova gēkpeputa ndi-Ya, Cheghari kwa ncheghari bayere ndi-orù-Ya; Mb͕e Ọ nāhu na ihe-iye-aka-ha alawo, Ọ dighi kwa onye eb͕ochiri eb͕ochi ma-ọbu onye arapuru arapu fọduru.


Chineke me ndi-iro Devid otú a, me kwa ha ihe ọzọ otú a, ọ buru na emem ka nwoke ọ bula fọdu rue ìhè ututu n'etiti ndi nile o nwere.


Ma otú ọ di, Jehova, bú Chineke Israel nādi ndu, Onye b͕ochiworom ka m'ghara imejọ gi, n'ezie ọ buru na i meghi ngwa bia izutem, agaghi-eme ka nwoke fọduru Nebal ma-ọli rue ìhè ututu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan