Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 21:19 - Bible Nso

19 Ma i gāgwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ì b͕uwo ọchu, nweta kwa? I gāgwa kwa ya okwu, si, Otú a ka Jehova siri, N'ebe nkita rachara ọbara Nebot ka nkita gāracha ọbara-gi, ọbuná nke gi onwe-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Gwa ya sị ya, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: I gbuola ọchụ mmadụ si otu a nwetara onwe gị ihe nketa? Ebe ahụ nkịta nọ rachaa ọbara Nebọt ka ha ga-anọ rachaakwa ọbara gị. E, ọbara gị onwe gị.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 21:19
23 Iomraidhean Croise  

O we si, Ònye gosiri gi na onye b͕a ọtọ ka i bu? Ì riwo nkpuru sitere n'osisi ahu, nke M'nyere gi iwu bayere ya, ka i ghara iri nkpuru sitere na ya?


Otú a ka Jehova siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ si n'ulo-gi bilie imegide i, M'gāchiri kwa ndinyom-i n'anya-gi nye ibe-gi, ọ gēso kwa ndinyom-i dina n'anya anyanwu a.


Gini mere i ji lelì okwu Jehova, ime ihe jọrọ njọ n'anya-Ya? i werewo mma-agha tib͕ue Uraia onye Het, nwunye-ya ka i werewo-kwa-ra n'onwe-gi na nwunye; ma ya onwe-ya, i werewo mma-agha umu Amon b͕ue ya.


Ewe ṅachapu ub͕ọ-ala-ya n'akuku ọdọ-miri Sameria; nkita we racha ọbara-ya; (ma ndinyom nākwa iko sara aru-ha n'ebe ahu;) dika okwu Jehova si di nke O kwuru.


Maranu ub͕u a na ọ dighi okwu ọ bula gāda n'ala nime okwu Jehova, nke Jehova kwuru bayere ulo Ehab: n'ihi na Jehova emewo ihe O kwuru n'aka orù-Ya, bú Elaija.


O rue, mb͕e akwukwọ ahu bara ha n'aka, na ha chiri umu eze, b͕ue ha, bú ọgu ndikom atọ na iri, tiye isi-ha nime nkata, zigara ya rue Jezreel.


Ma Elaisha nānọdu n'ulo-ya, ndi-okenye nānọdu kwa n'ebe ọ nọ: eze we ziga otù nwoke site n'iru ya: ma tutu onye-ozi ahu abiakute ya, ya onwe-ya siri ndi-okenye, Ùnu ahuwo na nwa ob͕u-madu a ezitewo iwezuga isim? hunu, mb͕e onye-ozi ahu nābia, mechienu uzọ, were ibo-uzọ kwagide ya: òlu ukwu abua nke onye-nwe-ya adighi n'azu ya?


Ha we kwuba Heman n'elu osisi nke o doziri nye Mọdekai. Ewe me ka ọnuma eze bìe.


Ọ buru na eriwom ihe-ọmume-ya nēnyeghi ego, Ma-ọbu me ka ndi-nwe-ya kubìe ume-ndu-ha:


Ka I we b͕aye ukwu-gi n'ọbara, Ka ire nkita-gi nile we si n'aru ndi-iro-gi kère òkè-ya.


Merem amara, Jehova; Hu nweda-n'alam nke sitere n'aka ndi nākpọm asì, Gi Onye nēbulim elu site n'ọnu-uzọ-ama ọnwu;


Jehova emewo ka amara Ya onwe-ya, ezi ikpe ka O kpeworo: N'ọlu nke ọbu-aka-ya abua ka amaworo onye nēmebi iwu dika n'ọnyà. Higgaion. Selah


Jeremaia, bú onye-amuma, we gwa Zedekaia, bú eze Juda, okwu ndia nile nime Jerusalem,


Ọzọ, onye-isi agaghi-ewere ihe ọ bula n'ihe-nketa nke ndim, inapu ha ihe-nketa-ha n'ike; ihe nke si n'ihe-onwunwe-ya puta ka ọ gēme ka umu-ya ndikom keta: ka ndim we ghara ib͕asa, onye ọ bula ọ pua n'ihe-onwunwe-ya.


Ahuhu diri onye ji ọbara ewu obodo, onye ji kwa ajọ omume me ka obodo guzosie ike!


Ahuhu diri onye nēritara ulo-ya urù ọjọ, ido akwu-ya n'elu, ka ewe naputa ya n'ọbu-aka ihe ọjọ!


N'ihi na ikpé unu ji kpe ka agēji kpe unu: ọ bu kwa ihe unu ji tù ihe ka agēji tùru unu.


Adoni-bezek we si, Ọgu eze atọ na iri, ndi ebipuru isi-aka-ha na isi-ukwu-ha, nāchikọta ihe n'okpuru table nkem: dika m'meworo, otú a ka Chineke kwughachiworom. Ha we me ka ọ ba na Jerusalem, ọ nwua n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan