Ehab we ba n'ulo-ya n'obi arọ́ na nb͕aru-iru, n'ihi okwu nke Nebot, bú onye Jezreel, gwara ya: n'ihi na ọ siri, M'gaghi-enye gi ihe-nketa nnam-hà. O we dina n'ihe-ndina-ya, chigharia iru-ya, o righi kwa nri.
Eze Israel we si Jehoshafat, Otù nwoke ọzọ di kwa iju Jehova ase n'aka-ya, bú Maikaia nwa Imla: ma mu onwem kpọrọ ya asì; n'ihi na ọ dighi-ebu amuma ezi ihe bayerem, kama ihe ọjọ. Jehoshafat we si, Ka eze ghara ikwu otú a.