Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 20:26 - Bible Nso

26 O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na Ben-hedad gukọtara ndi Siria, rigorue Efek, ibuso Israel agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 Mgbe otu afọ gasịrị, Ben-Hadad chịkọtakwara ndị Aram niile duru ha gaa Afek ibuso Izrel agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 20:26
10 Iomraidhean Croise  

O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na mb͕e ndi-eze nāpu ibu agha, na Devid zigara Joab, ya na ndi-orù-ya, na Israel nile; ha we bibie umu Amon, nọchigide kwa Raba n'agha. Ma Devid nānọdu na Jerusalem.


Onye-amuma ahu we biarue eze Israel nso, si ya, Je ime onwe-gi ka i di ike, mara, hu kwa ihe i nēme: n'ihi na n'ọb͕ub͕a arọ ka eze Siria ganārigota imegide gi.


ma gi onwe-gi, gutara onwe-gi usu-ndi-agha, dika usu-ndi-agha nke dapunariworo gi n'agha, inyinya n'ọnọdu inyinya, na ub͕ọ-ala n'ọnọdu ub͕ọ-ala: ayi gēbuso kwa ha agha n'ala di lari, ayi aghaghi kwa idi ike kari ha. O we ge nti olu-ha, me otú a.


Ndi fọduru we b͕alaga n'Efek, rue obodo; mb͕idi obodo we dakwasi orú nnù ndikom atọ na nnù asa na ọgu iri fọduru. Ma Ben-hedad b͕alagara, ba n'obodo, n'ime-ulo nke di n'ime-ulo.


Ọ si, Meghe window n'akuku Iru-anyanwu: o we meghe. Elaisha we si, B͕a: o we b͕a. Ọ si, Àkú nzọputa Jehova nwere, bú àkú nzọputa imegide Siria: i gētib͕u kwa Siria n'Efek, rue mb͕e i gēme ka ha gwusia.


site na Ndida: ala nile nke ndi Kenean, na Meara nke ndi Zaidon nwe, rue Efek, rue ókè-ala ndi-Amorait:


na Uma, na Efek, na Rehob: orú obodo na abua na obodo ntà ha.


Asha anapughi kwa ndi bi n'Ako, na ndi bi na Zaidon, na Ahlab, na Akzib, na Helba, na Afik, na Rehob, ala-ha:


Ma ndi Filistia chikọtara ọmuma-ulo-ikwū-ha nile rue Efek: Israel nāma kwa ulo-ikwū-ha n'akuku isi-iyi nke di na Jezreel.


Okwu Samuel we rue Israel nile nti. Israel we pua izute ndi Filistia ibu agha, we ma ulo-ikwū-ha n'akuku Eben-eza: ndi Filistia we ma ulo-ikwū-ha n'Efek.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan