Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 20:1 - Bible Nso

1 Ma Ben-hedad, bú eze Siria, chikọtara usu-ndi-agha-ya nile: orú ndi-eze na iri na abua soro kwa ya, ha na inyinya na ub͕ọ-ala: o we rigo, nọchigide Sameria n'agha, buso ya agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ugbu a, Ben-Hadad, bụ eze ndị Aram, chịkọtara ndị agha ya niile. Iri ndị eze atọ na abụọ sonyere ya, ha na ịnyịnya ha na ụgbọ agha ha. Ọ rịgooro nọchibido obodo Sameria buso ya agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 20:1
28 Iomraidhean Croise  

Esa we chiri ọla-ọcha nile na ọla-edo nile nke fọduru n'àkù ulo Jehova, na àkù ulo eze nile, nye ha n'aka ndi-orù-ya: eze, bú Esa, we ziga ha jekuru Ben-hedad, nwa Tab-rimon, nwa Hezion, bú eze Siria, nke bi na Damaskọs, si,


Ben-hedad we ge eze, bú Esa, nti, zite ndi-isi usu nile nke ndi-agha o nwere imegide obodo nile nke Israel, o we tib͕ue Ijon, na Dan, na Ebel-bet-meaka, na Kinerot nile, tiyere ala nile nke Naftali.


Ọ zuru ugwu Sameria n'aka Shema na talent ọla-ọcha abua; o wue ulo n'ugwu ahu, kpọ aha obodo ahu o wuru Sameria, n'aha Shema, bú onye-nwe ugwu ahu.


Ha we pua n'etiti-ehihie. Ma Ben-hedad nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo-ntu-ya, ya onwe-ya na ndi-eze, bú orú ndi-eze na iri na abua ahu ndi nēyere ya aka.


O we zigara Ehab, bú eze Israel, ndi-ozi, rue obodo, si ya,


Ma me ihe a; wezuga ndi-eze, nwoke ọ bula n'ebe-ya, do ndi nāchi ala n'ọnọdu ha:


Ma eze Siria nyere orú ndi-isi na iri na abua nke ub͕ọ-ala o nwere iwu, si, Unu ebusola onye ntà ma-ọbu onye uku agha, kama ọ bu eze Israel, nání ya.


Ma eze Siria nēbuso Israel agha; o we me ka ndi-orù-ya dua ya ọdu, si, N'ebe di otú a otú a ka ọmuma-ulo-ikwūm gādi.


O rue na, mb͕e ya onwe-ya nākọrọ eze otú o mere ka onye nwuru anwu di ndu ọzọ, le, nwayi ahu, onye o mere ka nwa-ya nwoke di ndu ọzọ nētiku eze nkpu bayere ulo-ya, baye-kwa-ra ala-ya. Gihezi we si, Onye-nwem eze, nka bu nwayi ahu, nka bu kwa nwa-ya nwoke, onye Elaisha mere ka ọ di ndu ọzọ.


Ataksakses, bú eze nāchi ndi-eze, nēdegara Ezra akwukwọ, bú onye-nchu-àjà, bú ode-akwukwọ nke iwu Chineke nke elu-igwe, onye zuru okè, na ihe ọzọ di otú a.


o chiri kwa nnù ub͕ọ-ala na ọgu iri arọputaworo, na ub͕ọ-ala nile nke Ijipt, na ndi-isi-agha n'elu ha nile.


N'ihi na ọ nāsi, Ndi-isim, hà nile abughi ndi-eze?


I siri n'aka ndi-orù-gi ta Onye-nwe-ayi uta, si, Ọtutu ub͕ọ-alam ka mu onwem jiri rigorue ebe di elu nke ugwu nile, rue akuku ime nile nke Lebanon; m'gēb͕utu kwa osisi cedar ya nile toro ogologo, na osisi fir ya nile arọputara arọputa: m'gābà kwa n'ebe di elu nke nsọtu-ya, oké ọhia nke ubi ọma ya.


M'gēsuye kwa ọku na mb͕idi Damaskọs, ọ gēripia kwa ulo nile di elu nke Ben-hedad.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka Nebukadreza, bú eze Babilon, si n'Ugwu biarue Taia, ọ bu eze nke ndi-eze, ọ gāchiri inyinya, chiri kwa ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya na nkpọkọta madu na ndi bara uba, bia.


Gi onwe-gi, eze, bu eze ndi-eze, onye Chineke nke elu-igwe nyeworo ala-eze a na àkù a na ike a na ebube a;


M'gēme kwa ka mma-agha biakwasi unu, nke nābọ̀ ọ́bọ̀ ọb͕ub͕a-ndum; agāchikọta kwa unu nime obodo nile unu: M'gēzite kwa ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu; agēnye kwa unu n'aka ndi-iro.


ma M'gēzite ọku n'ulo Hazael, ọ gēripia kwa ulo-elu nile nke Ben-hedad.


Mb͕e i nāpù ibuso ndi-iro-gi agha, i we hu inyinya, na ub͕o-ala, na ndi bara uba kari gi, atula egwu ha: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi, Onye nēme ka i si n'ala Ijipt rigoputa.


Ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile, rue mb͕e mb͕idi-gi nile gāda, bú mb͕idi ahu di elu nke ewusi-kwa-ra ike, nke gi onwe-gi nātukwasi obi na ha, n'ala-gi nile: ọ gānọchigide kwa gi n'agha n'ọnu-uzọ-ama-gi nile n'ala-gi nile, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi.


Adoni-bezek we si, Ọgu eze atọ na iri, ndi ebipuru isi-aka-ha na isi-ukwu-ha, nāchikọta ihe n'okpuru table nkem: dika m'meworo, otú a ka Chineke kwughachiworom. Ha we me ka ọ ba na Jerusalem, ọ nwua n'ebe ahu.


Umu Israel we tikue Jehova: n'ihi na o nwere nnù ub͕ọ-ala ígwè abua na ọgu ise; ya onwe-ya we meb͕usie umu Israel ike orú arọ.


Ndi Filistia we chikọta onwe-ha ibuso Israel agha, orú nnù ub͕ọ-ala uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù ndi-inyinya iri-na-ise, na ndi-agha dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba: ha we rigota, ma ulo-ikwū-ha na Mikmash, n'akuku Iru-anyanwu Bet-even.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan