Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 2:9 - Bible Nso

9 Ma ub͕u a agula ya n'onye ikpe nāmaghi, n'ihi na onye mara ihe ka i bu; i gāmara kwa ihe i gēme ya, ma i gēme ka isi-awọ-ya rida n'ala-mọ n'ọbara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ma achọghị m ka ị hapụ ya dịka onye ikpe na-amaghị. Ị bụ nwoke maara ihe. Ị makwaara ihe ị ga-eme ya. Mee ka o jiri isi awọ ọbara juru baa nʼili.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 2:9
13 Iomraidhean Croise  

Ọ si, Nwam agaghi-eso unu rida; n'ihi na nwa-nne-ya anwuwo, ya onwe-ya, nání ya, fọdukwara: asi na ajọ ihe adakwasi ya n'uzọ nke unu nēje na ya, unu gēweda kwa isi-awọm rue ala-mọ na nwuta.


o gēru kwa, mb͕e ọ huru na nwa-okoro ahu esoghi ayi bia, na ọ gānwu: ndi-orù-gi gēweda kwa isi-awọ orù-gi, bú nna-ayi, rue ala-mọ na nwuta.


Onye nāwusi ọbara madu, site n'aka madu ka agāwusi ọbara-ya: n'ihi na ọ bu n'onyinyo Chineke ka O mere madu.


Eze, bú Devid, we biarute Bahurim, ma, le, otú nwoke nke sitere n'ab͕uru ulo Sọl nēsi n'ebe ahu puta, aha-ya bu Shimai, nwa Gira: ọ nāputa, nākọcha ka ọ nāputa.


Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.


Gi me kwa dika amam-ihe-gi si di, ma ekwela ka isi-awọ-ya rida n'ala-mọ n'udo.


le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi.


Israel nile we nu ikpe eze kpere; ha we tua egwu eze: n'ihi na ha huru na amam-ihe Chineke di nime ya, ime ihe ekpere n'ikpe.


Anamatu ujọ ihe-nb͕um nile, Amawom na I gaghi-agum n'onye nēmeghi ihe ọjọ.


Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi.


n'ihi na nke ahu bu ihe-nb͕okwasi o nwere nání ya, nke ahu bu uwe-nb͕okwasi-ya iyikwasi n'akpukpọ-aru-ya: ọ̀ bu nime gini ka o gēdina? o gēru kwa, mb͕e ọ nētikum, na M'gānu; n'ihi na onye-amara ka M'bu.


Gi akọchala Chineke, abu-kwa-la onye-isi ndi-gi ọnu.


Ma ọ buru na unu emeghi otú a, le, unu emehiewo megide Jehova: mara-kwa-nu nmehie-unu, na ọ gāchọputa unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan