1 Ndị Eze 2:5 - Bible Nso5 Ọzọ kwa, gi onwe-gi amawo ihe Joab nwa Zeruaia merem, ihe o mere ndi-isi abua nke usu-ndi-agha nile nke Israel, bú Abnea nwa Nea na Amasa nwa Jeta, na o b͕uru ha, we wusi ọbara agha n'udo, tiye ọbara agha n'ihe-ọkiké-ya nke di n'úkwù-ya, na n'akpukpọ-ukwu-ya nke di n'ukwu-ya abua. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a5 “Ugbu a, gị onwe gị maara ihe Joab nwa Zeruaya mere m, ya bụ ihe o mere mmadụ abụọ bụ ndịisi agha Izrel, Abna nwa Nea, na Amasa nwa Jeta. O gburu ha, wufuo ọbara ha nʼoge udo, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe e mere nʼagha. O jikwa ọbara ahụ merụọ ihe okike o kere nʼukwu na akpụkpọụkwụ o yi nʼụkwụ. Faic an caibideil |