Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 2:37 - Bible Nso

37 O gēru kwa, n'ubọchi i gāpu, gabiga miri-iyi Kidron, na i gāmara nke-ọma na i ghaghi inwu: ọbara-gi gādi n'isi-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

37 Nʼihi na ụbọchị ị ga-apụ gafee iyi dị na Ndagwurugwu Kidrọn, mara nke ọma na ị ghaghị ịnwụ. Ọbara gị ga-adịkwa gị nʼisi.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 2:37
13 Iomraidhean Croise  

Devid we si ya, Ọbara-gi dikwasi n'isi-gi; n'ihi na ọnu-gi azawo megide gi, si, Mu onwem emewo ka ọ nwua, bú onye Jehova etere manu.


Ala ahu nile nākwa ákwá n'oké olu, ndi ahu nile nāgabiga kwa: eze nāgabiga kwa miri-iyi Kidron, ndi-ya nile nāgabiga kwa, n'iru uzọ ọzara.


Ọzọ kwa, Meaka, bú nne-ya, o wezuga-kwa-ra ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, o sure ya ọku na miri-iyi Kidron.


Eze we si ya, Me dika o kwuworo, dakwasi ya, lì kwa ya; ka i we si n'ebe m'nọ na n'ebe ulo nnam nọ wezuga ọbara awusiri n'efu, nke Joab wusiri.


Ọbara-ha gālaghachi kwa n'isi Joab, na n'isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova.


Shimai we si eze, Okwu a di nma: dika onye-nwem, bú eze, kwuworo, otú a ka orù-gi gēme. Shimai we biri na Jerusalem ọtutu ubọchi.


O si-kwa-ra n'ulo Jehova buputa Ashera je n'azu Jerusalem, rue miri-iyi Kidron, sure ya ọku n'akuku miri-iyi Kidron, supia ya me ka ọ di ka uzuzu, kpofue uzuzu-ya n'elu ílì ndi efu.


Ndi-nchu-àjà we ba n'ime-ime nke ulo Jehova, ime ka o di ọcha, ha we buputa ihe ruru árú nile nke ha chọtara n'ulo uku Jehova tiye ya n'ogige ulo Jehova. Ndi Livai we nara ya, ibupu ya je miri-iyi Kidron n'èzí.


Ndagwurugwu ahu nile nke ozu, na nke ntu, na ọzara nile rue miri-iyi Kidron, rue nkuku ọnu-uzọ-ama inyinya n'akuku ọwuwa-anyanwu, gābu ihe nsọ Jehova nwere; agaghi-eropu ya, agaghi-etikpọ kwa ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.


n'uma ka o nyeworo ego, ọ bu kwa ọmuru-nwa ka ọ naraworo: ọ̀ gādi kwa ndu? ọ gaghi-adi ndu: ihe-árú ndia nile ka o meworo: aghaghi ime ka ọ nwua; ọbara-ya gādi ya n'isi.


N'ihi na onye ọ bula nke nākọcha nna-ya ma-ọbu nne-ya, aghaghi ime ka ọ nwua: nna-ya ma-ọbu nne-ya ka ọ kọchaworo; ọbara-ya gādikwasi ya.


Mb͕e Jisus kwusiri okwu ndia, Ọ pua, Ya na ndi nēso uzọ-Ya, gabiga n'ofè iyi Kidron, ebe ubi ab͕ara ogige di, nke Ọ bàra nime ya, Ya onwe-ya na ndi nēso uzọ-Ya.


Ọ gēru kwa, na onye ọ bula nke gēsi n'ọnu-uzọ ulo-gi pua n'èzi, ọbara-ya gādikwasi n'isi-ya, ayi onwe-ayi gābu kwa ndi ikpe nāmagh: ma onye ọ bula gi na ya gānọ n'ulo, ọbara-ya gādikwasi n'isi-ayi, ma ọ buru na aka ọ bula adikwasi ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan