Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 2:28 - Bible Nso

28 Akukọ ahu we rue Joab nti: n'ihi na Joab wezugara onwe-ya iso Adonaija n'azu, ọ bu ezie na o wezugaghi onwe-ya iso Absalom n'azu. Joab we b͕alaga n'Ulo-ikwū Jehova, jide mpi ebe-ichu-àjà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Ma mgbe Joab nụrụ na Adonaịja anwụọla, ọ gbaara ọsọ gaa nʼụlọ nzute Onyenwe anyị jigide mpi dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja aka. Ọ bụ ezie na Joab so Adonaịja gbaa izu imegide Solomọn, ma o soghị Absalọm gbaa izu imegide Devid.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 2:28
8 Iomraidhean Croise  

Ma Amasa ka Absalom doro onye-isi usu-ndi-agha n'ọnọdu Joab. Ma Amasa bu nwa otù nwoke, aha-ya bu Itra onye Israel, onye bakuru Abigal nwa-nwayi Nehash, nwa-nne-nwayi nke Zeruaia nne Joab.


Devid we zipu ndi ahu, otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Abishai nwa Zeruaia, nwa-nne Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Itai, bú onye Gat Eze we si ndi-ya, Aghaghm iso unu pua, ọbuná mu onwem.


Ma Adonaija turu egwu n'ihi Solomon; o we bilie, je, jide mpi ebe-ichu-àjà.


Okwu-ya we di n'ebe Joab nwa Zeruaia nọ, na n'ebe Abaiata onye-nchu-àjà nọ: ha we so Adonaija nēyere ya aka.


Ma mb͕e onye ọ bula gēwere nganga biakwasi ibe-ya, ib͕u ya n'aghughọ; n'ebe-ichu-àjàm ka i gēwepu ya ka ọ nwua.


I gēme kwa mpì-ya n'elu nkuku anọ ya: mpì-ya gēsite na ya: i gāmachita kwa ya ọla.


Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi, Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu: N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso, Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan