Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 2:24 - Bible Nso

24 Ma ub͕u a Jehova nādi ndu, Onye meworo ka m'guzosie ike, O me kwa ka m'nọkwasi n'oche-eze Devid, bú nnam, Jehova Onye mewo-kwa-ram ulo, dika O kwuru, n'ezie agēme ka Adonaija nwua ta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ugbu a, dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ mere ka m nọgidesie ike nʼocheeze nna m Devid, onye mere ka ọchịchị eze m malite dịka o kwere na nkwa, a ga-eme ka Adonaịja nwụọ taa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 2:24
19 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a mma-agha agaghi-ewezuga onwe-ya n'ulo-gi rue mb͕e ebighi-ebi; n'ihi na i lelìwom, we kuru nwunye Uraia onye-Het ka ọ ghọrọ gi nwunye.


N'ihi na Gi onwe-gi, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke Israel, I kpughewo nti orù-Gi, si, M'gēwu-kwa-ra gi ulo: n'ihi nka orù-Gi nwetara obi-ike ikpere Gi ekpere a.


Eze we ṅua iyi, si, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile,


Ọzọ kwa, Solomon anọkwasiwo n'oche-eze nke ala-eze.


Solomon we si, Ọ buru na ọ ghọ onye nēme nke-ọma, ọ dighi otù nime agiri-isi-ya gāda n'ala: ma ọ buru na ahuta ihe ọjọ n'aru ya, ọ gānwu kwa.


Ka Jehova, bú Chineke-gi, buru onye agọziri agọzi, Onye ihe-gi tọrọ Ya utọ, itiyekwasi gi n'oche-eze Israel: ọ bu n'ihi na Jehova huru Israel n'anya rue mb͕e ebighi-ebi ka O doro gi eze, ime ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.


na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel: emewokwam ka ndi-iro-gi nile ruru ala. Anamegosi kwa gi na Jehova gēwuru gi ulo.


Ma nka bu ihe ntà n'anya-gi, Chineke; I we kwue okwu bayere ulo orù-Gi rue mb͕e di anya, I huwokwam dika ọnọdu nke madu nọ n'elu si di, Jehova, bú Chineke.


Ma ub͕u a, Jehova, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, ka eme ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo.


onye ahu gēwuru aham ulo; ya onwe-ya gāburum nwa, Mu onwem gābu-kwa-ra ya nna; M'gēme kwa ka oche-eze nke ala-eze-ya guzosie ike n'elu Israel rue mb͕e ebighi-ebi.


Solomon we nọkwasi n'oche-eze Jehova, buru eze n'ọnọdu Devid, bú nna-ya, ihe we nāgara ya nke-ọma; Israel nile we nēge ya nti.


Ọ buru na Jehova ewughi ulo, N'efu ka ha dọb͕uworo onwe-ha n'ọlu nime ya, bú ndi nēwu ya: Ọ buru na Jehova echeghi obodo, N'efu ka onye-nche muruworo anya.


O rue, n'ihi na ndinyom nke nēle ime nātu egwu Chineke, na O mere èzí-na-ulo nye ha.


Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu: Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya.


Biko, b͕aghara njehie orù-gi nwayi: n'ihi na Jehova aghaghi imere onye-nwem ulo kwesiri ntukwasi-obi, n'ihi na ọ bu agha nile nke Jehova ka onye-nwem nēbu; agaghi-ahuta kwa ihe ọjọ n'aru gi ubọchi-gi nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan