Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 2:19 - Bible Nso

19 Bat-sheba we bakuru eze, bú Solomon, igwa ya okwu bayere Adonaija. Eze we bilie izute ya, we kpọ isi ala nye ya, nọkwasi n'oche-eze-ya, dọbara nne eze oche-eze; o we nọdu n'aka-nri-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Emesịa, Batsheba bịakwutere eze Solomọn ịgwa ya okwu banyere Adonaịja. Mgbe ọ na-abata, eze sitere nʼocheeze ya bilie gaa izute ya, kpọkwaa isiala nye ya nọdụ ala nʼocheeze ya. O mere ka e butere nne eze ocheeze, ọ nọdụkwara ala nʼaka nri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 2:19
9 Iomraidhean Croise  

Josef we me ka ha puta n'etiti ikperè-ya abua: ọ kpọ isi ala, kpuchie iru-ya n'ala.


Ọzọ kwa, Meaka, bú nne-ya, o wezuga-kwa-ra ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, o sure ya ọku na miri-iyi Kidron.


Bat-sheba we si, Ọ di nma; mu onwem gāgwara gi eze okwu.


Ihe nke si n'ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua.


Umu-ndinyom ndi-eze muru nọ n'etiti ndinyom-i di oké ọnu-ahia: Nwunye-eze nēguzo onwe-ya n'aka-nri-gi yiri ọla-edo ọma nke Ofia.


Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.


Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


I gēbili ọtọ n'iru onye-isi-awọ, sọpuru kwa iru okenye, tu kwa egwu Chineke-gi: Mu onwem bu Jehova.


Ọ gēdebe kwa aturu n'aka-nri-Ya, ma umu-ewu n'aka-ekpe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan