Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 2:15 - Bible Nso

15 Ọ si, Gi onwe-gi amawo na ọ bu mu nwe ala-eze, ọ bu kwa mu ka Israel nile doro iru-ha, ka m'buru eze: ma ala-eze chighariri, we ghọ ihe diri nwa-nnem: n'ihi na o sitere n'aka Jehova diri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ọ zara sị, “Dịka ị maara, ọ bụ m nwe alaeze a. Ndị Izrel niile lekwara anya na m ga-abụ eze ha. Ma otu ọ dị, ihe niile adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, alaeze a aghọọla nke nwanne m, nʼihi na o si nʼaka Onyenwe anyị rute ya aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 2:15
19 Iomraidhean Croise  

Devid we kasie Bat-sheba, bú nwunye-ya, obi, we bakuru ya, ya na ya we dina: o we mua nwa-nwoke, Devid we kpọ aha-ya Solomon. Jehova we hu ya n'anya;


Onye nēgosi ihe we biakute Devid, si, Obi ndikom Israel di iso Absalom n'azu.


Absalom we mere Israel nile dika okwu a si di, bú ndi biakutere eze ka ekpe ha ikpe: Absalom we zuru obi ndikom Israel n'ori.


Hushai we si Absalom, É-è, kama onye Jehova na ndi nka na ndikom nile nke Israel rọputaworo, ya ka m'gādiri, ọ bu kwa n'aka-ya ka m'gēbiri.


nwa-ya nwoke nke-abua bu Kileab, nke Abigail nwunye Nebal, bú onye Kamel, muru; nke-atọ bu Absolom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua;


nke-anọ bu Adonaija nwa Hagit; nke-ise bu Shefataia nwa Abital;


Mb͕e ubọchi-gi zuru, mb͕e gi gēsoro nna-gi-hà dina kwa n'ọnwu, M'gēme kwa ka o bilie, bú nkpuru-gi nke gānọchi gi, nke gēsi n'afọ-gi puta, M'gēme kwa ka ala-eze-ya guzosie ike.


N'ihi na ọ ridawo ta, chiri ehi na anu mara abuba na ìgwè ewu na aturu riri nne chua àjà, kpọ kwa umu-ndikom nile nke eze, kpọ kwa ndi-isi usu-ndi-agha, kpọ kwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà; ma, le, ha nēri ihe nāṅu kwa ihe-ọṅuṅu n'iru ya, si, Ka eze, bú Adonaija, di ndu.


Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, we rida, me ka Solomon nọkwasi n'inyinya mule nke eze, bú Devid, me ka o jerue Gaihon.


Zedok, bú onye-nchu-àjà, we si n'Ulo-ikwū were mpi manu ahu, te Solomon. Ha we fùa opì-ike; ndì Israel nile we si, Ka eze, bú Solomon, di ndu.


Ma Adonaija nwa Hagit nēweli onwe-ya elu, si, Mu onwem gābu eze: o we doziere onwe-ya ub͕ọ-ala, na ndi-inyinya, na ọgu ndikom abua na iri ndi nāb͕a ọsọ n'iru ya.


Ọ si kwa, Enwerem okwu igwa gi. Ọ si, Kwue.


Ma ub͕u a otù aririọ ka mu onwem nāriọ n'aka-gi, achughachila irum. Ọ si ya Kwue.


Eze, bú Solomon, we za, si nne-ya, N'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nāriọrọ Adonaija Abishag, bú nwayi Shunem? riọ-kwa-ra ya ala-eze; n'ihi na ya onwe-ya bu nwa-nnem nke-okenye; riọrọ ya ala-eze, riọ-kwa-ra Abaiata, bú onye-nchu-àjà, riọ-kwa-ra Joab nwa Zeruaia.


Ọ dighi amam-ihe di, ọ dighi kwa nghọta di, Ọ dighi kwa ndum-ọdu di, na ncherita-iru Jehova.


Ya onwe-ya nēkpughe ihe nile di omimi di kwa nzuzo: Ọ mawo ihe di n'ọchichiri, ìhè nēbi kwa n'ebe Ọ nọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan