Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 19:4 - Bible Nso

4 Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n'ọzara, bia nọdu n'okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n'ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ma ya onwe ya pụkwara jee ije otu ụbọchị nʼọzara naanị ya. Nʼikpeazụ, ọ kwụsịrị nọdụ ala nʼokpuru otu osisi brum, kpee ekpere rịọọ ka a napụ ya ndụ ya. Ekpere o kpere nʼoge a bụ, “O zuorela m Onyenwe anyị, biko napụ ndụ m. O nweghị ụzọ m si dị mma karịa nna nna m ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 19:4
19 Iomraidhean Croise  

O we jeso onye nke Chineke ahu n'azu, chọta ya ka ọ nānọdu n'okpuru osisi terebinth: ọ si ya, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye Chineke ahu nke siri na Juda bia? Ọ si, Ọ bu mu onwem.


O we tua egwu, bilie, je n'ihi ndu-ya, biarue Bia-sheba, nke Juda nwere, o me ka nwa- okorọbia-ya nọdu n'ebe ahu.


O dina, raru ura n'okpuru otù osisi broom; ma, le, mọ-ozi nēmetu ya aka, si ya, Bilie, rie ihe.


O rue na, mb͕e ha nọ nēje, nēje ije nēkwu kwa okwu, le, ub͕ọ-ala ọku na inyinya ọku, nke kewara ha abua; Elaija we rigorue elu-igwe n'oké ifufe.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na aririọm abia; Asi kwa na Chineke enyem olile-anyam!


Ọbuná ka Chineke kwe izọpiam; Ka Ọ tọpu aka-Ya, bipum.


M'we si, M'gaghi-ehota Ya, m'gaghi-ekwu kwa okwu ọzọ n'aha-Ya. O we di n'obim dika ọku nēre ere nke emechibidoro n'ọkpukpum nile, ike gwu-kwa-ram inagide ya, enweghkwam ike.


Gabiganu rue Kalne, hu; si-kwa-nu n'ebe ahu jerue Hemat nke bara uba: rida-kwa-nu rue Gat nke ndi Filistia: hà di nma kari ala-eze ndia? ma-ọbu ókè-ala-ha, ò riri nne kari ókè-ala-unu?


Ma ub͕u a, Jehova, biko, wepu ndum n'arum; n'ihi na ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n'isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


Ì di nma kari No-amon, nke bi n'etiti osimiri Nail nile, nke miri di ya buruburu; nke ékpè-ya bu oké osimiri, oké osimiri ka mb͕idi-ya sitere?


Ma ọ buru na otú a ka Gi onwe-gi nēmem, biko, gbuziem, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi; ka m'ghara kwa ilekwasi ihe ọjọm anya.


Lenu anu-ufe nke elu-igwe, na ha adighi-agha nkpuru, ha adighi-ewè kwa ihe-ubi, ha adighi-ekpokọta kwa ihe ba n'ọba; ma Nna-unu nke elu-igwe nāzù ha. Ùnu onwe-unu abughi ihe oké ọnu-ahia kari ha?


ma isi-iyi Jekob di n'ebe ahu. Ya mere Jisus, ebe ike gwuru Ya n'ije-Ya, Ọ nọduru ala otú a n'usọ isi-iyi ahu. Ọ ra ka oge hour nke-isi.


Gini kwa? àyi ka ha nma? É-è, ayi akaghi ha nma ma-ọli: n'ihi na ayi buru uzọ bo ndi-Ju bo kwa ndi-Grik ebubo, na ha nile nọ n'okpuru nmehie;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan