Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 19:17 - Bible Nso

17 Ọ gēru kwa, na onye nēwepuga onwe-ya na mma-agha Hazael, Jihu gēme ka ọ nwua: onye nēwepuga kwa onwe-ya na mma-agha Jihu, Elaisha gēme ka ọ nwua.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Onye ọbụla gbanarịrị Hazael ga-anwụ nʼaka Jehu. Otu a kwa, ndị niile gbanarịrị mma agha Jehu ka Ịlaisha ga-egbu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 19:17
22 Iomraidhean Croise  

Na mb͕e ahu ka Jehova malitere ibipu ufọdu n'Israel: Hazael we tib͕ue ha n'ókè ala nile nke Israel;


Mb͕e ahu Hazael, bú eze Siria, rigoro, buso Gat agha, were ya: Hazael we che iru-ya imegide Jerusalem.


Ma Hazael, bú eze Siria, meb͕uru Israel ub͕ochi nile nke Jehoahaz.


Iwe Jehova we di ọku megide Israel, O nye ha n'aka Hazael, bú eze Siria, na n'aka Ben-hedad nwa Hazael, ubọchi nile.


Hazael we si, Gini mere onye-nwem nākwa ákwá? Ọ si, N'ihi na amawom ihe ọjọ nke i gēme umu Israel: i gēsu ebe nile ha ewusiri ike ọku, i gēwere kwa mma-agha b͕ue umu-okorobia-ha, i gātupia kwa umu-ha nāṅu ara, i gāb͕awa ndinyom-ha di ime afọ.


Eze we si Hazael, Were onyinye-inata-iru-ọma n'aka-gi, je izute onye nke Chineke, jua Jehova ase site n'aka-ya, si, M'gādiri ndu n'ọria nka?


Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi we kekọta madu imegide Joram. (Ma Joram nēche Remot-gilead, ya onwe-ya na Israel nile, n'ihi Hazael, bú eze Siria:


Mb͕e i biara ebe ahu, gi hu Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi anya n'ebe ahu, ba nime, me ka o bilie site n'etiti umu-nne-ya, me kwa ka ọ ba n'ime-ulo di n'ime-ulo.


Onye-nche we gosi, si, Ọ biaruru ha aru, ma ọ latagh: ma odudu-inyinya di ka odudu-inyinya Jihu nwa Nimshi; n'ihi na o nēdu inyinya dika onye nāwi ara.


Jihu we dọtia uta-ya ka aka-ya ra, b͕ata Jehoram n'ab͕ata ogwe-aka-ya abua, àkú we si n'obi-ya puta, o we ruru ala n'ub͕ọ-ala-ya.


Jihu we si Bidka, bú onye-isi-agha-ya, Bulie ya, tubà n'òkè ubi Nebot, bú onye Jezreel: n'ihi na cheta na mu na gi nānọkwasi n'elu inyinya, ayi abua, nēso Ehab, bú nna-ya, mb͕e Jehova boro ya ibu a;


kama ọ gēji ezi omume kpe ndi nēnweghi ike ikpe, ọ gēji kwa izi-ezi ba nba bayere ndi di ume-ala n'obi n'uwa: ọ gēji kwa ndele nke ọnu-Ya tib͕ue uwa, ọ gēji kwa iku-ume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua me ka ndi nēmebi iwu nwua.


le, emewom gi ta ka i lekọta mba nile, lekọta kwa ala-eze nile, iropu, na ikwada, na ime ka ha la n'iyì, na itikpọ, na iwu ulo, na iku ihe.


Onye ahu nke nāb͕apu n'iru oké egwu ahu gādabà n'olùlù ahu; ọzọ, onye ahu nke nārigoputa n'òlùlù ahu, agējide ya n'ib͕udu ahu: n'ihi na M'gēme ka arọ nleta-ha biakute ya, bú Moab; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


M'gēche kwa irum imegide ha; ọku ka ha siworo puta, ma ọku gēripia ha; unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'doro irum imegide ha.


N'ihi nka ka M'jiworo ndi-amuma b͕utue ha; ejiwom okwu nile nke ọnum b͕ue ha: ikpé-gi nile di kwa ka ìhè nke nāputa aputa.


Ebe-nb͕alaga gālanari kwa onye ukwu ọsọ n'iyì, onye di ike agaghi-ab͕a kwa ike-ya ume, dike agaghi-ewepuga onwe-ya:


Dika agāsi na otù onye nāb͕apu n'iru ọdum, anu-ọhia bear we zute ya; o we ba n'ulo-ya dabere aka-ya na mb͕idi, agwọ we ta ya.


ewe were mma-agha nke Onye ahu nānọkwasi n'inyinya ahu, bú mma-agha ahu nke si n'ọnu-Ya puta, b͕ue ndi fọduru: nnunu nile we rijuru afọ site n'anu-aru-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan