1 Ndị Eze 18:40 - Bible Nso40 Elaija we si ha, Jidenu ndi-amuma Beal; ekwela ka otù nwoke nime ha wepuga onwe-ya. Ha we jide ha: Elaija we me ka ha ridarue miri-iyi Kaishon, o b͕ue ha n'ebe ahu. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a40 Mgbe ahụ, Ịlaịja nyere ha iwu sị, “Jidenụ ndị amụma Baal niile. Unu ekwekwala ka otu onye nʼime ha laa.” Ha jidekwara ha niile. Ịlaịja dukwaara ha niile gaa na ndagwurugwu iyi Kishọn, gbuo ha nʼebe ahụ. Faic an caibideil |
Ma agēme ka onye-amuma ahu, ma-ọbu ọrọ-nrọ ahu, nwua; n'ihi na o kwuworo okwu nwezuga megide Jehova, bú Chineke-unu, (Onye nēme ka unu si n'ala Ijipt puta, Onye nāb͕aputa kwa gi n'ulo ndi-orù), ka o we duhie gi n'uzọ ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu ije ije nime ya. I we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.