1 Ndị Eze 18:26 - Bible Nso26 Ha we were oke-ehi nke enyere ha, ha we dozie ya, kpọkue aha Beal site n'ututu we rue etiti-ehihie, si, Beal, za ayi. Ma ọ dighi olu di, ọ dighi kwa onye nāza. Ha we wukwasi n'elu ebe-ichu-àjà nke emere. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a26 Ya mere, ndị amụma Baal weere oke ehi ahụ e nyere ha doziekwa ya. Mgbe ahụ, ha kpọkuru aha Baal, chi ha. Site nʼụtụtụ tigide mkpu ruo nʼetiti ehihie na-asị “O Baal, biko, zaa anyị.” Ma o nweghị ihe ha nụrụ site nʼọnụ Baal. Ọ dịkwaghị onye zara ha. Ha malitere ite egwu gburugburu ebe ịchụ aja ahụ ha kwadoro. Faic an caibideil |
ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh: