1 Ndị Eze 18:24 - Bible Nso24 Unu gākpọku kwa aha chi-unu, ma mu onwem gākpọku aha Jehova: ọ gēru kwa, na chi ahu nke nēwere ọku za, onye ahu bu Chineke. Ndi Israel nile we za, si, Ọ di nma, bú okwu a. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a24 Emesịa, unu ga-akpọku chi Baal unu, mụ onwe m kwa ga-akpọku aha Onyenwe anyị. Ọ ga-erukwa na chi ga-eji ọkụ za, chi ahụ bụ Chineke.” Ndị Izrel niile zara sị, “Okwu gị dị mma.” Faic an caibideil |
Eze we si, Àka Joab diyere gi n'ihe a nile? Nwayi ahu we za, si, Ndu nke nkpuru-obi-gi, onye-nwem, bú eze, ọ dighi onye ọ bula nēsi n'ihe ọ bula onye nwem, bú eze, kwuru, che iru n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: n'ihi na orù-gi, bú Joab, ya onwe-ya nyerem iwu, ya onwe-ya tiye-kwa-ra okwu ndia nile n'ọnu nwayi nējere gi ozi: