Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 18:10 - Bible Nso

10 Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, ọ dighi mba ma-ọbu ala-eze ma-ọli, ebe onye-nwem nēzigaghi ichọ gi: ma mb͕e ha siri, Ọ nọghi n'ebe a, o me ka ala-eze ahu na mba ahu ṅua iyi, na ha achọtaghi gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Dịka Onyenwe anyị Chineke gị sị adị ndụ, o nwebeghị mba maọbụ alaeze dị nke nna m ukwu na-ezigaghị mmadụ ịchọ gị. Ebe ọbụla ọ gara a na-akọrọ ya na Ịlaịja anọghị nʼebe ahụ. Ehab na-eme ka eze obodo ahụ ṅụọ iyi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 18:10
20 Iomraidhean Croise  

Eze we ṅua iyi, si, Jehova nādi ndu, Onye b͕aputaworo nkpuru-obim na nkpab͕u nile,


Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n'arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di.


Nwayi ahu we si, Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, Ọ dighi ob͕e achicha m'nwere ma-ọli, ma nání otù nju-aka utu ọka n'okpokoro, na nwantī manu n'ite: ma, le, anamachikọta nkú abua, ka m'we ba, were ya doziere onwem, dozi-kwa-ra nwam nwoke, ka ayi we rie ya, nwua.


O we je, me dika okwu Jehova si di: o je biri na miri-iyi Kerit, nke di n'iru Jọdan.


Bilie, je Zarefat, nke diri Zaidon, biri n'ebe ahu: le, enyewom otù nwayi di-ya nwuru nọ n'ebe ahu iwu izù gi.


Ma ub͕u a gi onwe-gi nāsi, Je, si onye-nwe-gi, Le, Elaija abiawo.


Elaija we si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, n'ezie ta ka m'gēme ka ọ hum anya.


Ọ si, Gini ka m'mehieworo, na gi onwe-gi nēnye orù-gi n'aka Ehab, ime ka m'nwua?


Ma ub͕u a Jehova nādi ndu, Onye meworo ka m'guzosie ike, O me kwa ka m'nọkwasi n'oche-eze Devid, bú nnam, Jehova Onye mewo-kwa-ram ulo, dika O kwuru, n'ezie agēme ka Adonaija nwua ta.


Maikaia we si, Jehova nādi ndu, n'ezie ihe Jehova gāsim, nke ahu ka m'gēkwu.


Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n'ala ọku ọku; Anējide ha na nzube nile nke ha chère.


I nēzobe ha n'ebe-nzuzo nke iru-Gi ka ha pua n'aka nkekọta nile nke madu: I nēdebe ha na nzuzo n'ulo-ntu ka ha pua n'ise-okwu nke ire di iche iche.


Onye nēbi n'ebe-nzuzo nke Onye kachasi ihe nile elu, Ọ bu n'okpuru ǹdò nke Onye puru ime ihe nile ka ọ nānọ ọnọdu-abali.


Ndi-isi we si Beruk, Je, zobe onwe-gi, gi onwe-gi na Jeremaia; ekwe-kwa-la onye ọ bula mara ebe unu onwe-unu nọ.


Eze we nye Jeramil nwa eze na Seraia nwa Azriel na Shelemaia nwa Abdeel iwu iwere Beruk, bú ode-akwukwọ, Jeremaia, bú onye-amuma: ma Jehova zobere ha.


Ya mere ha tuturu nkume itu Ya: ma Jisus zobere Onwe-ya, we si n'ulo uku Chineke pua.


Ma hunu, we mara ebe-izo-nzuzo nile ebe o nēzo onwe-ya, unu biaghachikutekwam mb͕e unu dozisiri onwe-unu, m'gēso kwa unu je: o gēru kwa, ọ buru na ọ nọ n'ala nka, na m'gāchọputa ya n'usu nnù ndikom Juda abua na ọgu iri nile.


Ekish we kpọ Devid, si ya, Jehova nādi ndu, n'ezie onye ziri ezi ka i bu: ọpupu-gi na nbata-gi n'ọmuma-ulo-ikwū n'akam di kwa nma n'anyam: n'ihi na ahutaghm ihe ọjọ n'aru gi site n'ubọchi i biakuterem rue ta: ma n'anya ndi-isi onye nādighi nma ka i bu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan