Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 16:9 - Bible Nso

9 Orù-ya Zimri, bú onye-isi nkera ub͕ọ-ala-ya, we kekọta madu imegide ya: ma ya onwe-ya nọ na Tiaza, nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo Aza, onye bu onye-isi ulo-ya na Tiaza:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mgbe ahụ, Zimri, ọchịagha na-achị ọkara ụgbọala agha eze, gbara izuzu megide ya. Nʼoge a, Ela nọ na-aṅụ mmanya na Tịaza, nʼụlọ Aza, onye na-elekọta ụlọeze dị nʼobodo ahụ. Ọ ṅụkwara mmanya ahụ ṅụbiga ya oke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 16:9
28 Iomraidhean Croise  

Abram we si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, gini ka I gēnyem, ebe mu onwem gaje ib͕a aka nwa si n'uwa la, ma onye gēnweta ulom bu Damesek Elieza?


Orù ahu we chiri kamel iri, nime kamel nile nke onye-nwe-ya, je; ezi ihe nile nke onye-nwe-ya di kwa n'aka-ya: o bilie, je Mesọpọtemia, rue obodo Nehoa.


Abraham we si orù-ya, bú okenye nke ulo-ya, onye nāchi ihe nile o nwere, Biko, tiye aka-gi n'okpuru apata-ukwum:


Josef we huta amara n'iru ya, we jere ya ozi: ọ me ya onye nēlekọta ulo-ya anya, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyere n'aka-ya.


ọ dighi uku n'ulo a kari mu onwem; o b͕ochighi kwa ihe ọ bula n'ebe m'nọ ma-ọbughi nání gi, n'ihi na gi onwe-gi bu nwunye-ya: m'gēsi kwa aṅa me oké ihe ọjọ nka, mehie megide Chineke?


Beasha, bú nwa Ahaija, nke ulo Isaka, we kekọta madu imegide ya; Beasha we tib͕ue ya na Gibeton, nke diri ndi Filistia; n'ihi na Nedab na Israel nile nānọchigide Gibeton n'agha.


Zimri we ba, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, n'arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, o we buru eze n'ọnọdu ya.


N'arọ nke-orú-na-isi nke Esa, bú eze Juda, ka Ila nwa Beasha malitere ibu eze Israel nime Tiaza, arọ abua.


Ehab we kpọ Obadaia, onye bu onye-isi ulo-ya. (Ma Obadaia nātu egwu Jehova nke-uku:


O rue, mb͕e Ben-hedad nuru okwu a, mb͕e ọ nāṅu ihe-ọṅuṅu, ya onwe-ya na ndi-eze, n'ulo-ntu, na ọ siri ndi-orù-ya, Donu onwe-unu n'usoro. Ha we do onwe-ha n'usoro imegide obodo ahu.


Ha we pua n'etiti-ehihie. Ma Ben-hedad nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo-ntu-ya, ya onwe-ya na ndi-eze, bú orú ndi-eze na iri na abua ahu ndi nēyere ya aka.


Ndi-orù-ya we bilie, kekọta nkekọta-madu imegide ya, tib͕ue Joash n'ulo Milo, n'uzọ nke nāridaru Sila.


Shalum nwa Jedesh we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya n'iru ndi Israel, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya.


Peka nwa Remalaia, bú onye-isi-agha-ya, we kekọta madu imegide ya, tib͕ue ya nime Sameria, n'ulo-elu nke ulo eze, ya na Agob na Arie; ọgu ndikom abua na iri nke umu ndi Gilead nọye-kwa-ra ya: o we me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya.


Hoshea nwa Ila we kekọta nkekọta-madu megide Peka nwa Remalaia, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, we buru eze n'ọnọdu ya, n'arọ nke-orú nke Jotam nwa Uzaia.


Jihu nwa Jehoshafat nwa Nimshi we kekọta madu imegide Joram. (Ma Joram nēche Remot-gilead, ya onwe-ya na Israel nile, n'ihi Hazael, bú eze Siria:


Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine; Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di?


M'gēme kwa ndi-isi-ya, na ndi-ya mara ihe, na ndi-ya nāchi ala, na ndi-ya nọchiri anya eze, na ndi-dike-ya, ka ha ṅubiga manya ókè; ha gāraru kwa ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.


N'abali ahu ka eb͕uru Belshaza, bú eze Kaldea.


N'ihi na ọ bu ezie na ha di ka ogwu tuhiri atuhi, buru kwa ndi ṅubigaworo manya ókè dika n'iṅubiga-manya-ókè-ha, ọku gēripia ha dika ahihia-ọka kpọnwusiri akpọnwu.


Ma nēzenu onwe-unu, ka aghara iwere imebiga-ajọ-ihe-ókè, na iṅubiga-manya-ókè, na ncheb͕u nke ndu a, bob͕u obi-unu ma eleghi anya, ubọchi ahu we biakwasi unu na mberede dika ọnyà;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan