Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 16:30 - Bible Nso

30 Ehab nwa Ọmri mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova kari ndi nile buru ya uzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

30 Ehab nwa Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze niile buru ya ụzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 16:30
11 Iomraidhean Croise  

ma i mewo ihe ọjọ kari ndi nile buru gi uzọ, i we je mere onwe-gi chi ọzọ di iche iche, na arusi a kpuru akpu, ikpasum iwe, i we tufuem n'azu gi:


Ọmri mere ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, me kwa ihe ọjọ kari ndi nile buru ya uzọ.


Ma n'arọ nke-orú-na-iri-na-asatọ nke Esa, bú eze Juda, ka Ehab, bú nwa Ọmri, malitere ibu eze Israel: Ehab nwa Ọmri we buru eze Israel nime Sameria orú arọ na abua.


O rue, dika agāsi na ọ bu ihe nfe na ọ nējeghari na nmehie nile nke Jeroboam, bú nwa Nebat, na ọ luru Jezebel na nwunye, bú nwa-nwayi Etbeal eze ndi Zaidon, ọ we je fè Beal òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ya.


Ehab me-kwa-ra Ashera; Ehab we me ihe ọzọ ikpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe, kari ndi-eze nile nke Israel ndi buru ya uzọ.


(Otú ọ di, ọ dighi onye di ka Ehab, onye rere onwe-ya ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, onye Jezebel, bú nwunye-ya, rafuru.


O fè-kwa-ra Beal òfùfè, kpọ isi ala nye ya, we kpasue Jehova, bú Chineke Israel, iwe, dika ihe nile si di nke nna-ya mere.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, nání na o meghi dika ndi-eze Israel ndi buru ya uzọ.


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova; nání na o meghi dika nna-ya, na dika nne-ya: o wezuga ogidi Beal nke nna-ya mere.


O rue, mb͕e Jehoram huru Jihu, na ọ siri, Ùdo di kwa, Jihu? Ọ si, Gini bu udo ahu, na mb͕e ikwa-iko Jezebel, bú nne-gi, na mb͕asi-ya nādi ọtutu?


kama i jewo ije n'uzọ ndi-eze Israel, me Juda na ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, dika ulo Ehab mere ka akwa iko; ọzọ kwa, umu-nne-gi ndikom, bú ulo nna-gi, ndi di nma kari gi onwe-gi, ka i b͕uworo:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan