Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 16:11 - Bible Nso

11 O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, mb͕e ọ nọkwasiri n'oche-eze-ya, na o tib͕uru ulo Beasha nile: o kweghi ka otù nwa-nwoke fọduru ya, ma ọ bu nime ndi-ikwu-ya, ma-ọbu nime ndi-eyì-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ngwangwa ọ ghọrọ eze, nọkwasị nʼocheeze ya, o gburu mmadụ niile nọ nʼezinaụlọ Baasha. Ọ hapụghị ọ bụladị otu nwoke. O gburu ikwu na ibe Baasha, na ndị enyi ya niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 16:11
10 Iomraidhean Croise  

n'ihi nka, le, M'nēme ka ihe ọjọ biakute ulo Jeroboam, M'gēbipu kwa n'aru Jeroboam nwa-nwoke ọ bula, onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel, M'gēkpochapu kwa nke fọduru nke ulo Jeroboam, dika madu si ekpochapu ǹsí-anu, rue mb͕e agēkpochapuzu ya.


O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, na o tib͕uru ulo Jeroboam nile; o kweghi ka onye ọ bula nke nēku ume fọduru Jeroboam, rue mb͕e o kpochapuru ya; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Ahaija onye Shailo:


Zimri we ba, tib͕ue ya, me ka ọ nwua, n'arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, o we buru eze n'ọnọdu ya.


le, M'nēkpochapu nke fọduru nke Beasha, bú nke fọduru nke ulo-ya; M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam, bú nwa Nebat.


M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija, n'ihi nkpasu-iwe nke i ji kpasum iwe, me kwa ka Israel mehie.


M'gēme kwa ulo Ehab ka ọ di ka ulo Jeroboam nwa Nebat, ka ọ di kwa ka ulo Beasha nwa Ahaija.


Ka eriri-umu-ya diri nbipu; N'ọb͕ọ soro ha ka ehichapu aha-ha.


Adoni-bezek we si, Ọgu eze atọ na iri, ndi ebipuru isi-aka-ha na isi-ukwu-ha, nāchikọta ihe n'okpuru table nkem: dika m'meworo, otú a ka Chineke kwughachiworom. Ha we me ka ọ ba na Jerusalem, ọ nwua n'ebe ahu.


Chineke me ndi-iro Devid otú a, me kwa ha ihe ọzọ otú a, ọ buru na emem ka nwoke ọ bula fọdu rue ìhè ututu n'etiti ndi nile o nwere.


Ma otú ọ di, Jehova, bú Chineke Israel nādi ndu, Onye b͕ochiworom ka m'ghara imejọ gi, n'ezie ọ buru na i meghi ngwa bia izutem, agaghi-eme ka nwoke fọduru Nebal ma-ọli rue ìhè ututu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan