Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 15:22 - Bible Nso

22 Ma eze, bú Esa, mere ka Juda nile nu; ọ dighi onye puru ya: ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; eze, bú Esa, we were ha wue Geba Benjamin na Mizpa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Mgbe ahụ, eze Asa nyere iwu zigara ndị Juda niile, na ọ dịghị onye iwu ahụ hapụrụ, ha bịara bupusịa nkume na osisi niile dị na Rema, nke Baasha ji na-ewu ihe nʼebe ahụ. Eze Asa ji ihe ndị a wulie Geba nke Benjamin, wuokwa Mizpa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 15:22
11 Iomraidhean Croise  

Beasha, bú eze Israel, we rigo imegide Juda, wue Rema, ka ọ ghara ikwe Esa, bú eze Juda, ka o nwe onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata.


O me-kwa-ra ka ndi-nchu-àjà nile si n'obodo Juda nile bia, o meru-kwa-ra ebe nile di elu ebe ndi-nchu-àjà surere ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, site na Geba rue Bia-sheba; ọ kwatu-kwa-ra ebe nile di elu nke ọnu-uzọ-ama nke di n'oghere ọnu-uzọ-ama Joshua, bú onye-isi obodo, nke di n'aka-ekpe madu n'ọnu-uzọ-ama obodo.


Ma Esa, bú eze, chiri Juda nile; ha we bupu nkume nile nke Rema, na osisi-ya nile, nke Beasha ji wu ya; o we were ha wue Geba na Mizpa'


Ma mu onwem, le, m'ganēbi na Mizpa, iguzo n'iru ndi Kaldea, ndi gābiakute ayi: ma unu onwe-unu, chikọtanu manya-vine na nkpuru nke mb͕e nghọkọta-nkpuru na manu, tiye ha n'ihe-unu, biri-kwa-nu n'obodo nile unu nke unu wereworo.


Jeremaia we biakute Gedalaia nwa Ahaikam rue Mizpa, ya na ya we biri n'etiti ndi Israel ndi fọduru n'ala-ha.


Ma olùlù ahu ebe Ishmael tubàra ozu nile nke ndikom ahu ndi o tib͕uru, n'akuku Gedalaia, (olùlù ahu bú nke Esa, bú eze, mereri n'ihi Beasha, bu eze Israel,) olùlù ahu ka Ishmael nwa Netanaia were ndi eb͕uru eb͕u tujue.


Ala nka nile gāghọ ihe di ka Araba, site na Geba rue Rimon na Ndida Jerusalem: agēbuli kwa ya elu, ọ gēbi kwa n'ọnọdu-ya, site n'ọnu-uzọ-ama Benjamim rue ebe ọnu-uzọ-ama mbu, rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, site kwa n'ulo-elu Hananel rue ebe-nzọcha-nkpuru-vine nile nke eze.


na Kefa-amoni, na Ọfni, na Geba; obodo iri na abua na obodo ntà ha:


na Mizpeh, na Kefira, na Moza;


Site kwa n'ebo Benjamin, Gibeon na ebe-ita-nri-ya nile, na Geba na ebe-ita-nri-ya nile;


Samuel we si, Chikọtanu Israel nile rue Mizpa, m'gēkpe-kwa-ra Jehova ekpere bayere unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan