Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 15:18 - Bible Nso

18 Esa we chiri ọla-ọcha nile na ọla-edo nile nke fọduru n'àkù ulo Jehova, na àkù ulo eze nile, nye ha n'aka ndi-orù-ya: eze, bú Esa, we ziga ha jekuru Ben-hedad, nwa Tab-rimon, nwa Hezion, bú eze Siria, nke bi na Damaskọs, si,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Mgbe ahụ, Asa chịịrị ọlaọcha na ọlaedo niile dị nʼụlọakụ ụlọnsọ Onyenwe anyị, na ndị dị nʼụlọeze ya, nyefee ya nʼaka ndị ozi ya ka ha chịrị ha zigara Ben-Hadad, nwa Tabrimọm, nwa Hezion, bụ eze Aram, onye na-achị na Damaskọs, sị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 15:18
16 Iomraidhean Croise  

Ọ we kesa onwe-ya imegide ha n'abali, ya onwe-ya na ndi-orù-ya, o tib͕ue ha, chua ha rue Hoba, nke di n'aka-ekpe Damaskọs.


Abram we si, Onye-nwe-ayi, bú Jehova, gini ka I gēnyem, ebe mu onwem gaje ib͕a aka nwa si n'uwa la, ma onye gēnweta ulom bu Damesek Elieza?


o wepu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze; ọbuná ha nile ka o wepuru: o wepu-kwa-ra ọta ọla-edo nile nke Solomon mere.


Ọ chibata n'ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ.


Mb͕e ahu Hazael, bú eze Siria, rigoro, buso Gat agha, were ya: Hazael we che iru-ya imegide Jerusalem.


Jehoash, bú eze Juda, we chiri ihe nsọ nile nke Jehoshafat, na Jehoram, na Ehazaia, nna-ya-hà, bú ndi-eze Juda, doro nsọ, na ihe nsọ ya nile, na ọla-edo nile anāchọta n'àkù nile nke ulo Jehova, na nke ulo eze, zigara Hazael, bú eze Siria: o we si na Jerusalem rigo.


Ma okwu Joash nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda?


Ọ chibata n'ulo Jehova ihe nile nna-ya doro nsọ, na ihe nile ya onwe-ya doro nsọ, bú ọla-ọcha, na ọla-edo, na ihe di iche iche ọzọ.


M'gēsuye kwa ọku na mb͕idi Damaskọs, ọ gēripia kwa ulo nile di elu nke Ben-hedad.


ma M'gēzite ọku n'ulo Hazael, ọ gēripia kwa ulo-elu nile nke Ben-hedad.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan