Rehoboam we biarue Jerusalem, kpọkọta ulo Juda nile, na ebo Benjamin, orú nnù ndikom orú uzọ na abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nēbu agha, ibuso ulo Israel agha, iweghachiri Rehoboam nwa Solomon ala-eze.
Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu, bú umu Israel, agha: laghachinu, nwoke ọ bula n'ulo-ya; n'ihi na n'ebe M'nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, laghachi azu n'ulo-ha, dika okwu Jehova si di.
Ma ihe nile Rehoboam mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere nke Shemaia, bú onye-amuma, na n'akwukwọ Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere akwukwọ-osuso-ọmumu? Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile.