Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 13:5 - Bible Nso

5 Ab͕awa-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu, ewe si n'ebe-ichu-àjà wusi ntu, dika ihe-iriba-ama si di nke onye nke Chineke nyere n'okwu Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ọzọkwa, ebe ịchụ aja ahụ gbawara abụọ, ntụ dị nʼelu ya wụsịkwara nʼala dịka ihe ịrịbama nke onye amụma Chineke nyere, site nʼokwu Onyenwe anyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 13:5
13 Iomraidhean Croise  

O nye-kwa-ra ihe-iriba-ama n'ubọchi ahu, si, Nka bu ihe-iriba-ama ahu nke Jehova kwuworo: Le, agāb͕awa ebe-ichu-àjà nka, wusi kwa ntu nke di n'elu ya.


O rue, mb͕e eze nuru okwu onye nke Chineke ahu, nke ọ kpọrọ megide ebe-ichu-àjà nime Bet-el, na Jeroboam siri n'ebe-ichu-àjà setipu aka-ya, si, Jidenu ya. Aka-ya, nke o setiri imegide ya, we kpọnwua, ọ pughi kwa iseghachi ya n'aru ya.


Eze we za, si onye nke Chineke, Biko, chọ ime ka iru Jehova, bú Chineke-gi, dajua, gi kpe kwa ekpere bayerem, ka akam we laghachikutem. Onye nke Chineke ahu we chọ ka iru Jehova dajua, aka eze we laghachikuru ya, we di ka ọ di na mbu.


Okpokoro utu ọka ahu agwughi, ite manu ahu akọghi kwa, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka Elaija.


Maikaia we si, Ọ buru na i laghachi ma-ọli n'udo, Jehova ekwughi okwu n'ọnum. Ọ si, Nurunu, ndi nile n'uwa, unu nile.


Agha we la elu n'ubọchi ahu: ewe me ka eze guzogide n'ub͕ọ-ala-ya imegide Siria, o we nwua n'anyasi: ọbara ebe ab͕aruru ya aru we b͕apu ba n'etiti ub͕ọ-ala-ya.


N'ihi na n'ubọchi M'gēji njehie nile nke Israel leta ya, n'ubọchi ahu ka M'gēji kwa nmehie ebe-ichu-àjà nke Bet-el leta ha, agēbipu kwa mpi nile nke ebe-ichu-àjà ahu, ha ewe da n'ala.


Ndi ahu we pua, kwusa ebe nile, Onye-nwe-ayi nēso kwa ha n'ilu ọlu, nēme okwu-ha ka o guzosie ike site n'ihe-iriba-ama di iche iche nke nēso. Amen.


Okwu nke onye-amuma nēkwu n'aha Jehova, ma okwu ahu emeghi, o reghi kwa; nke ahu bu okwu nke Jehova nēkwugh: na nganga ka onye-amuma ahu kwuworo ya, atula ujọ ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan