27 O we gwa umu-ya okwu, si, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwa ya.
27 Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu.” Ha mere otu a.
O we si umu-ya, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwara ya inyinya-ibu: ọ nọkwasi n'elu ya.
Onye-amuma ahu nke mere ka o si n'uzọ laghachi we nu ya, ọ si, Onye nke Chineke ahu ka ọ bu, bú onye nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova: Jehova we were ya nye ọdum, o we dọb͕ue ya, me ka ọ nwua, dika okwu Jehova si di, nke Ọ gwara ya.
O je chọta ozu-ya, ka atupuru ya n'uzọ, na inyinya-ibu na ọdum, ka ha nēguzo n'akuku ozu ahu: ọdum erighi ozu ahu, ọ dọb͕ughi kwa inyinya-ibu ahu.