Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 13:11 - Bible Nso

11 Ma otù onye-amuma, bú agadi, bi na Bet-el; nwa-ya we bia, kọrọ ya akukọ omume nile nke onye nke Chineke mere ubọchi ahu na Bet-el: okwu nile ọ gwara eze, ha we kọrọ nna-ha akukọ okwu ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ma o nwere otu onye amụma bụ agadi bi na Betel. Onye ụmụ ya bịara kọọrọ ihe niile onye nke Chineke ahụ mere nʼụbọchị ahụ na Betel, ha kọkwaara nna ha ihe niile ọ gwara eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 13:11
13 Iomraidhean Croise  

O we la n'uzọ ọzọ, ọ laghachighi kwa n'uzọ o siri biaru Bet-el.


Nna-ha we gwa ha okwu, si, Òle nke bu uzọ o jere? Ma umu-ya ndikom ahuwo uzọ nke onye nke Chineke ahu jere, bú onye siri na Juda bia.


Ma, le, ndikom nāgabiga, ha we hu ozu, ka atupuru ya n'uzọ, hu kwa ọdum, ka o nēguzo n'akuku ozu ahu: ha we bia, kwue ya n'obodo nke onye-amuma ahu, bú agadi, nēbi nime ya.


Ọ si, Ya nọduru onwe-ya; ka nwoke ọ bula ghara ichipu ọkpukpu-ya. Ha we rapu ọkpukpu-ya, ha na ọkpukpu onye-amuma ahu nke siri na Sameria bia.


bú ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma bayere Jerusalem, ndi nāhu-kwa-ra ya ọhù udo, ma udo adighi; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Nwa nke madu, bue amuma megide ndi-amuma Israel ndi nēbu amuma, gi si ndi nēbu amuma si n'obi-ha puta, Nurunu okwu Jehova;


Belam we welie anya-ya abua, hu Israel ka ha nānọ n'ulo-ikwū-ha dika ebo nile ha si di; Mọ nke Chineke we dikwasi ya.


Ọtutu madu gāsim n'ubọchi ahu, Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, àyi jiri aha-Gi bu amuma, àyi jiri kwa aha-Gi chupu ndi-mọ ọjọ, àyi jiri kwa aha-Gi lu ọtutu ọlu di ike?


(ma ọ buru na onye ọ bula amataghi otú ọ gāchi èzí-na-ulo nke aka ya, ò gēsi aṅa le nzukọ Chineke anya nke-ọma?)


ma aturu ya nmebi iwu nke aka ya n'anya: inyinya-ibu nke dara ob͕i were olu madu kwu okwu we b͕ochie anya-adighi-nma nke onye-amuma ahu.


O rue, mb͕e ndi nile ndi mara ya na mb͕e gara aga huru, ma, le, ọ nēso ndi-amuma bū amuma, ndi ahu we sirita onwe-ha, Gini bu nka nke mere nwa Kish? Sọl, ọ̀ di kwa n'etiti ndi-amuma?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan