Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 12:22 - Bible Nso

22 Okwu Chineke we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ma okwu Chineke rutere Shemaya onye nke Chineke ntị, sị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 12:22
17 Iomraidhean Croise  

Ma, le, onye nke Chineke siri na Juda bia n'okwu Jehova rue Bet-el: ma Jeroboam nēguzo n'akuku ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.


Ma otù onye-amuma, bú agadi, bi na Bet-el; nwa-ya we bia, kọrọ ya akukọ omume nile nke onye nke Chineke mere ubọchi ahu na Bet-el: okwu nile ọ gwara eze, ha we kọrọ nna-ha akukọ okwu ahu.


Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua?


Nwayi ahu we si Elaija, Ub͕u a amawom nka na onye nke Chineke ka i bu, na okwu Jehova bu kwa ezi-okwu n'ọnu-gi.


Ọ si, Na mb͕e nka akara àkà, dika mb͕e a aka-nile, gi onwe-gi ganāb͕aku nwa-nwoke. Ọ si, É-è, onye-nwem, gi onye nke Chineke, agwala orù-gi nwayi okwu-ugha.


Ọ kpọ di-ya, si, Biko, ziterem otù nime umu-okorọbia, na otù nime nne-inyinya-ibu, ka m'we b͕akuru onye nke Chineke, lata kwa.


O we je, biakute onye nke Chineke ahu, rue ugwu Kamel. O rue, mb͕e onye nke Chineke huru ya site na ncherita-iru ya, na ọ siri Gihezi, bú nwa-okorọbia-ya, Le, nwayi Shunem ahu:


O we biakute onye nke Chineke rue ugwu ahu, jide ya n'ukwu-ya abua. Gihezi we biarue nso inupu ya; ma onye nke Chineke siri, Ra ya aka: n'ihi na nkpuru-obi-ya di ilu nime ya; ma Jehova ezonariwom ya, O gosighkwam ya.


O we bia, gosi onye nke Chineke. Ọ si, Je, re manu ahu, kwua ugwọ-gi, gi onwe-gi na umu-gi ndikom were nke fọduru di ndu.


O rue, mb͕e Elaisha bú onye nke Chineke, nuru na eze Israel dọwara uwe-ya nile, o we zigara eze ozi, si, N'ìhi gini ka i dọwara uwe-gi nile? biko, ka ọ biakutem, ọ gāmara kwa na onye-amuma di n'Israel.


Okwu Jehova we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si,


Ma ihe nile Rehoboam mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere nke Shemaia, bú onye-amuma, na n'akwukwọ Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere akwukwọ-osuso-ọmumu? Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile.


m'we me ka ha bata n'ulo Jehova, n'ime-ulo umu Henan nwa Igdalaia, bú onye nke Chineke, nke di n'akuku ime-ulo ndi-isi, nke di n'elu ime-ulo Maaseia nwa Shalum, bú onye-nche nke nbata-uzọ:


Nka bu kwa ngọzi ahu, nke Moses, bú onye nke Chineke, gọziri umu Israel tutu ọnwu-ya.


Ma gi onwe-gi, onye nke Chineke, nāb͕anari ihe ndia; ma nāb͕aso ezi omume, nsọpuru-Chineke, okwukwe, ihu-n'anya, ntachi-obi, idi-nwayọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan