Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 12:18 - Bible Nso

18 Eze, bú Rehoboam, we ziga Adoram, onye bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè; Israel nile we were nkume tub͕ue ya, o we nwua. Eze, bú Rehoboam, we b͕a onwe-ya ume irigo n'ub͕ọ-ala-ya, ib͕alaga na Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Eze Rehoboam zipụrụ Adoniram, onyeisi na-elekọta ndị ọrụ mmanye, ma ndị Izrel niile ji nkume tugbuo ya. Ma eze Rehoboam jisiri ike gbaba nʼime ụgbọ agha ya, gbalaga laa Jerusalem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 12:18
12 Iomraidhean Croise  

Adoram bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè: Jehoshafat nwa Ahailud bu onye-ncheta:


Ahisha bu onye-isi ulo eze; Adonairam nwa Abda bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè.


O ziga ha na Lebanon, orú nnù ndikom na nnù ise n'ọnwa na nb͕anwe: otù ọnwa ka ha nọ na Lebanon, ọnwa abua n'ulo: Adonairam bu kwa onye-isi usu ndi nēfè òfùfè.


Eze, bú Rehoboam, we ziga Hadoram, onye bu onye-isi usu ndi nēfè òfùfè; umu Israel we were nkume tub͕ue ya, o we nwua. Eze, bú Rehoboam, we b͕a onwe-ya ume irigo n'ubọ-ala-ya, ib͕alaga na Jerusalem.


Ha we kekọta onwe-ha imegide ya, were nkume tub͕ue ya, n'ihi ihe eze nyere n'iwu, n'ogige ulo Jehova.


Moses we tikue Jehova, si, Gini ka m'gēme ndi nka? ọ fọduru ihe ntà ka ha tub͕uem na nkume.


onye obi-ya nwere ume n'etiti ndi-dike gāb͕a ọtọ b͕alaga n'ubọchi ahu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Nzukọ Israel nile we si ka ewere nkume tub͕ue ha. Ewe me ka umu Israel nile hu ebube Jehova anya n'ulo-ikwū nzute.


Mb͕e ahu ọchi-agha ahu na ndi nēje ozi jere, kuta ha, ma ha ejighi ihe-ike; n'ihi na ha nātu egwu ndi-Ju, ka aghara itu ha nkume.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan