Josef we hu umu-nne-ya, ọ mata ha, ma ọ mere onwe-ya dika onye ala ọzọ n'ebe ha nọ, ọ we kpayere ha uka ike, si ha, Òle ebe unu si bia? Ha si, Site n'ala Kenean izuru ihe-oriri.
Ndikom Israel we za ndikom Juda, si, Òkè iri ka ayi nwere n'eze, ọzọ kwa, ayi nwere òkè nime Devid kari unu: gini me-kwa-ra unu lelìri ayi anya, ka okwu-ayi ghara ibu uzọ n'ime ka eze-ayi lata? Ma okwu ndikom Juda siri ike kari okwu ndikom Israel.
o we gwa ha okwu dika idu-ọdu nke umu-okorọbia si di, si, Nnam mere yoke-unu ka ọ di arọ́, ma mu onwem gātukwasi ihe na yoke-unu: nnam were utari dọ unu aka na nti, ma mu onwem gēwere akpi dọ unu aka na nti.
Ma ònye mara ma ọ gābu onye mara ihe ma-ọbu onye-nzuzu? ma ọ gāchi ndọb͕um nile nke m'dọb͕uworo onwem n'ọlu, na nke m'meworo n'amam-ihe n'okpuru anyanwu. Nka bu kwa ihe-efu.
Ma amam-ihe ahu nke si n'elu bia buru uzọ di ọcha, emesia ọ di udo, nwe obi-ọma, nēkweye okwu nke-ọma, juputa n'ebere na ezi nkpuru, nēnweghi obi-abua, nēnweghi iru-abua.