Rehoboam we biarue Jerusalem, kpọkọta ulo Juda na Benjamin, orú nnù ndikom orú uzọ na abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nēbu agha, ibuso Israel agha, iweghachiri Rehoboam ala-eze:
na madu ufọdu siri na Shekem, si kwa na Shailo, si kwa na Sameria, bia, bú ọgu ndikom anọ, ndi akọpusiri afu-ọnu-ha, ndi uwe nile ha dọwara adọwa, ndi nēbì kwa onwe-ha mma, jide onyinye-inata-iru-ọma na frankincense n'aka-ha, iwebata ya n'ulo Jehova.
Joshua we chikọta ebo nile nke Israel rue Shekem, ọ kpọ ndi-okenye Israel, na ndi-isi-ha, na ndi-ikpé-ha, na ndi-odozi-okwu-ha; ha we guzo onwe-ha n'iru Chineke.
Ha we lìe ọkpukpu Josef, nke umu Israel si n'Ijipt bugota, nime Shekem, n'òkè ọhia ahu nke Jekob zutara n'aka umu Hemoa nna Shekem n'ọgu nkpuru-ego ise: ha we ghọrọ umu Josef ihe-nketa.
Ndi nile nwe Shekem we chikọta onwe-ha, ha na ulo nile nke Milo, ha we je me Abimelek ka ọ buru eze, n'akuku osisi terebinth nke ogidi ahu nke di na Shekem.