Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 11:9 - Bible Nso

9 Jehova we wesa Solomon iwe, n'ihi na ewezugara obi-ya n'ebe Jehova nọ, bú Chineke Israel, Onye mere ka ọ hu Ya anya ub͕ò abua,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Onyenwe anyị were iwe dị ukwuu megide Solomọn, nʼihi na obi ya esitela nʼebe Onyenwe anyị Chineke Izrel nọ pụọ, bụ onye mere ka ọ hụ ya anya ugboro abụọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 11:9
20 Iomraidhean Croise  

Iru-újú ahu we gabiga, Devid we ziga, webata ya n'ulo-ya, o we ghọrọ ya nwunye, muara ya nwa. Ma ihe Devid mere jọrọ njọ n'anya Jehova.


Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n'ebe ahu n'ihi nmehie-ya; o we nwua n'ebe ahu n'akuku ib͕e Chineke.


Otú a ka o me-kwa-ra ndinyom-ya nile, bú ndi ala ọzọ, ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāchu-kwa-ra chi nile ha àjà.


Na Gibeon ka Jehova mere ka Solomon hu Ya anya na nrọ nke abali: Chineke we si, Riọ ihe M'gēnye gi.


na Jehova mere ka Solomon hu Ya anya nke ub͕ò abua, dika O mere ka ọ hu Ya anya na Gibeon.


Ọ we jọ njọ n'anya Chineke bayere okwu a, O we tib͕ue Israel.


Iwe Jehova we di ọku n'aru Moses, Ọ we si, Ọ̀ nọghi, bú Eron nwa-nne-gi, bú onye Livai? amawom na ya onwe-ya nēkwu okwu nke-ọma. Ọzọ kwa, le, ya onwe-ya nāputa izute gi: ma mb͕e ọ huru gi, ọ gāṅuri n'obi-ya.


Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di.


Ikwa-iko na manya-vine na manya-vine ọhu nēwepu obi amam-ihe.


Iwe Jehova we di ọku megide ha; Ọ we la.


Ma Jehova webigara iwe ókè n'arum n'ihi unu, O geghi-kwam nti: Jehova we sim, O zuwo gi; agwa-kwa-lam okwu bayere ihe a ọzọ ma-ọli.


N'ihi na ọ gēwezuga nwa-gi nwoke n'isom n'azu, ka ha we fè chi ọzọ: iwe Jehova gādi kwa ọku megide unu, Ọ gēkpochapu kwa gi ngwa ngwa.


Jehova wesa-kwa-ra Eron iwe nke-uku ikpochapu ya: m'we kpe kwa ekpere bayere Eron na mb͕e ahu.


Na Horeb ka unu kpasu-kwa-ra Jehova iwe, Jehova we wesa unu iwe ikpochapu unu.


n'ihi na Dimas rapuru náním, ebe ọ huru oge di ub͕u a n'anya, o we ga Tesalọnaika; Kresens gara Galetia, Taitọs gara Dalmetia.


Echeghariwom na emewom Sọl eze: n'ihi na o siwo n'isom n'azu laghachi, ma o meghi ka okwum guzosie ike. Iwe Samuel we di ọku; o we tikue Jehova nkpu abali ahu nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan