Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 11:8 - Bible Nso

8 Otú a ka o me-kwa-ra ndinyom-ya nile, bú ndi ala ọzọ, ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, nāchu-kwa-ra chi nile ha àjà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 O mekwara otu ihe ahụ nye ndị nwunye ya niile si mba ọzọ, bụ ndị na-achụ aja nsure ọkụ ihe na-esi isi ụtọ, na-achụkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nye chi niile ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 11:8
10 Iomraidhean Croise  

Ma eze, bú Solomon, huru ọtutu ndinyom ala ọzọ n'anya, tiyere nwa-nwayi Fero, ndinyom Moab, ndinyom Amon, ndinyom Edom, ndinyom Zaidon, ndinyom Het;


Mb͕e ahu Solomon wubere ebe di elu nye Kemosh, bú ihe-árú Moab, n'ugwu nke di n'iru Jerusalem, nye kwa Molek, bú ihe-árú umu Amon.


Jehova we wesa Solomon iwe, n'ihi na ewezugara obi-ya n'ebe Jehova nọ, bú Chineke Israel, Onye mere ka ọ hu Ya anya ub͕ò abua,


O we me ka ndi edoro nsọ ikwa iko si n'ala-ya gabiga, o wezuga-kwa-ra arusi nile nke nna-ya-hà mere.


Ọ̀ bughi n'ihe ndia ka Solomon, bú eze Israel, mehiere? ma n'etiti ọtutu mba ọ dighi eze di ka ya, onye Chineke huru n'anya ka ọ bu kwa, Chineke we me ya eze Israel nile: ọbuná onye ahu ka ndinyom ala ọzọ mere ka o mehie.


N'ihi na ihe ikpasu iwem na ikpasu ọnumam ka obodo a buruworom site n'ubọchi mb͕e ha wuru ya we rue ta; ka M'we si n'irum wezuga ya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan