Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 11:39 - Bible Nso

39 M'gēweda kwa nkpuru Devid n'ihi nka, ma ọ bughi ubọchi nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

39 Aga m eweda agbụrụ Devid nʼihi ihe a, ma ha agaghị abụ ndị e wedara nʼala ruo ebighị ebi.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 11:39
18 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ayi aghaghi inwu, ayi di kwa ka miri nke anāwusi n'ala, nke anāgaghi-achikọta; ma Chineke ewepughi ndu, kama Ọ nēchè èchìchè, ka onye achupuru achupu we ghara ibu onye achupuru n'ebe Ọ nọ.


Ma nwa-ya ka M'gēnye otù ebo, ka Devid, bú orùm, we nwe oriọna ubọchi nile n'irum na Jerusalem, bú obodo nke M'rọputaworo Onwem itiye aham n'ebe ahu.


O gēru kwa, ọ buru na i nu ihe nile M'gēnye gi n'iwu, ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, me ihe ziri ezi n'anyam, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu, dika Devid, bú orùm, mere; na M'gānọyere gi, wu-kwa-ra gi ulo kwesiri ntukwasi-obi, dika M'wuru Devid, M'gēnye kwa gi Israel.


Solomon we chọ ime ka Jeroboam nwua: Jeroboam we bilie, b͕alaga n'Ijipt jekuru Shaishak, bú eze Ijipt, ọ we nọ n'Ijipt rue ọnwu Solomon.


Israel nile we hu na eze egeghi ha nti, ndi Israel we weghachiri eze okwu, si, Òkè gini ka ayi nwere nime Devid? ọ dighi kwa ihe-nketa di nime nwa Jese: lanu n'ulo-ikwū-unu, Israel: ub͕u a le ulo-gi, Devid. Israel we la n'ulo-ikwū-ha.


we dowapu ala-eze n'ulo Devid, nye gi ya: ma i dighi ka orùm, bú Devid, onye debere ihe nile M'nyere n'iwu, o were obi-ya nile jesom, ime nání ihe ziri ezi n'anyam;


N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel.


Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.


n'ihi na ta n'obodo Devid ka amuru nye unu Onye-nzọputa, Nke bu Kraist Onye-nwe-ayi.


Josef we si kwa na Galili, site n'obodo Nazaret, rigo na Judia, ba n'obodo Devid nke anākpọ Betlehem, n'ihi na o si n'ulo na agburu Devid puta;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan