Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 11:3 - Bible Nso

3 O we nwe nnù ndinyom na ọgu iri-na-ise, bú umu ndi-isi, na ọgu ndi-iko-nwayi iri-na-ise: ndinyom-ya we wezuga obi-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ọnụọgụgụ ndị inyom Solomọn lụrụ dị narị asaa, bụ ndị amụrụ nʼobi ndị eze. O nwekwara ndị iko nwanyị, ọnụọgụgụ ha dị narị atọ. Ndị inyom ya duhiere obi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 11:3
12 Iomraidhean Croise  

Rehoboam we hu Meaka nwa Absalom n'anya kari ndinyom-ya nile na iko-ya ndinyom nile: (n'ihi na ndinyom iri na asatọ ka ọ lutara, nwe kwa ọgu iko-ndinyom atọ, o we mua orú umu-ndikom na asatọ na ọgu umu-ndinyom atọ).


Ubọchi ta ka ndinyom ndi-isi nke Peasia na Midia, bú ndi nuworo okwu a bayere nwunye eze, gāsi kwa ndi-isi nile nke eze otú a, nleda-anya na iwe nke zuru ezu gāputa kwa.


achikọta-kwa-ram nye onwem ọla-ọcha na ọla-edo, na ihe nke aka ndi-eze na ala nile m'nāchi achi: edozi-kwa-ram nye onwem ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom, na ihe-utọ nile nke umu madu, ndi-iko nwayi bara uba nke-uku.


nke nkpuru-obim nọ nāchọsi ike rue ub͕u a, ma achọputaghm ya: otù madu n'etiti nnù madu abua na ọgu iri ka m'chọtaworo; ma ọ dighi otù nwayi nime ndi ahu nile ka m'chọtaworo.


Ọgu eze-nwanyi atọ di, ọgu ndinyom anọ, nke bu iko, di kwa, Na umu-ab͕ọghọ nādighi ọnu-ọgugu.


Nání otù ka ọ bu, bú ndurum, onye nkem nke zuru okè; Nání otù nwa nne-ya muru ka ọ bu; Onye arọputara arọputa nke nwanyi muru ya nwere ka ọ bu. Umu-ndinyom huru ya, we si na ọ bu onye ihe nāgara nke-ọma; E, ọgu eze-nwanyi atọ ahu na ọgu ndinyom anọ ahu, bú iko, ha we to ya.


Ọ gaghi-eme kwa ka ndinyom bara ya uba, ka obi-ya we ghara iwezuga onwe-ya: ọ gaghi-eme kwa ka ọla-ọcha na ọla-edo bara ya uba nke-uku.


ha we lutara onwe-ha umu-ha ndinyom na nwunye, were umu-ha ndinyom nye umu-ha ndikom, fè kwa chi nile ha òfùfè.


O we ba n'ulo nna-ya n'Ọfra, b͕ue umu-nne-ya, bú umu Jerubeal, ọgu madu atọ na iri, n'elu otù nkume: ma Jotam nwa Jerubeal nke-ntà fọduru; n'ihi na o zoro onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan