Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 11:29 - Bible Nso

29 O rue, na mb͕e ahu, na Jeroboam siri na Jerusalem pua, onye-amuma, bú Ahaija, bú onye Shailo, we chọta ya n'uzọ; ma Ahaija nēwere uwe ọhu yikwasi n'aru-ya; ha abua nọ kwa iche, nání ha, n'ọhia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Ma otu ụbọchị, mgbe Jeroboam si Jerusalem na-apụ, o zutere Ahija onye amụma, onye Shilo, nʼụzọ, ebe o yi uwe ọhụrụ. Ọ bụkwa naanị ha abụọ nọ nʼọhịa mgbe ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 11:29
10 Iomraidhean Croise  

Ken we si Ebel, bú nwa-nne-ya, Ka ayi je n'ọhia. O rue, mb͕e ha nọ n'ọhia, na Ken biliri imegide Ebel, bú nwa-nne-ya, we b͕ue ya.


Nwayi nējere gi ozi nwe-kwa-ra umu-ndikom abua, ha abua we lua ọ̀gù n'ọhia, ọ dighi kwa onye-nnaputa n'etiti ha, ma otù onye tib͕uru ibe-ya, me ka ọ nwua.


Jehova we si Solomon, N'ihi na nka di n'aka-gi, i we ghara idebe ọb͕ub͕a-ndum na ukpurum nile, nke M'nyeworo gi n'iwu, aghaghm idọwapu ala-eze n'aru gi, nye orù-gi.


Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Jehova, ka O we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Jehova gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo.


O rue, mb͕e Jeroboam nwa Nebat nuru ya, (ma onye ahu nānọ n'Ijipt rue mb͕e ahu, ebe o siri n'iru Solomon, bú eze, b͕alaga, Jeroboam we biri n'Ijipt,


Jeroboam we si nwunye-ya, Biko, bilie, nwogharia onwe-gi, ka aghara imara na gi onwe-gi bu nwunye Jeroboam: i gēje kwa Shailo; le, n'ebe ahu ka Ahaija, bú onye-amuma, nọ; onye ahu kwuru okwu bayerem na m'gābu eze ndi nka.


Nwunye Jeroboam we me otú a, we bilie, je Shailo, ba n'ulo Ahaija. Ma Ahaija apughi ihu uzọ; n'ihi na anya-ya guzoro eguzo n'ihi agadi-ya.


Eze we ghara ige ndi Israel nti; n'ihi na nchighari nka sitere n'aka Chineke, ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike, bú nke Ọ gwara Jeroboam nwa Nebat site n'aka Ahaija onye Shailo.


Ma ihe nile Solomon mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ndia n'akwukwọ ihe emere nke Netan, bú onye-amuma, na n'obubu-amuma nke Ahaija, bú onye Shailo, na n'ọhù nile nke Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere Jeroboam nwa Nebat?


Nzukọ nile nke umu Israel we kpọkọta onwe-ha na Shailo, ma ulo-ikwū nzute n'ebe ahu: ewe buda ala ahu n'iru ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan