Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 11:28 - Bible Nso

28 Nwoke ahu, bú Jeroboam, bu dike nke bu dìnkpà: Solomon we hu nwa-okorọbia ahu, na onye nēje ozi nke-ọma ka ọ bu, o we me ya ka ọ buru onye-nlekọta ibū nile nke ulo Josef.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Ugbu a Jeroboam, nʼonwe ya, bụ dimkpa. Mgbe Solomọn hụrụ otu nwokorobịa a si arụzi ọrụ ya nke ọma, o mere ya onye nlekọta ndị ọrụ niile si nʼezinaụlọ Josef.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 11:28
13 Iomraidhean Croise  

ala Ijipt, n'iru gi ka ọ di; me ka nna-gi na umu-nne-gi biri n'ebe kachasi nma nke ala nka; ha gēbiri n'ala Goshen: ọ buru kwa na i mara, si, na ndi-dìnkpà dí n'etiti ha, i gēdo kwa ha ndi-isi anu-ulo m'nwere.


N'ihi na orù-gi amawo na mu onwem emehiewo: ma, le, abiawom ta, buru ulo nile nke Josef uzọ irida izute onye-nwem, bú eze.


Ma Jeroboam nwa Nebat, onye Efrata nke Zerida, bu orù Solomon nwere, aha nne-ya bu Zerua, nwayi di-ya nwuru, o weli-kwa-ra aka-ya megide eze.


Je, si Jeroboam, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: N'ihi na esim n'etiti ndim welie gi elu, me gi onye-ndú ndim, bú Israel,


nāgughi ndi-isi nke ndi edoro ndi-isi, bú ndi Solomon nwere, ndi bu isi n'ije-ozi ahu, nnù ndikom asatọ na ọgu ise, ndi nwere ike n'aru ndi ahu ndi nālu ọlu n'ije-ozi ahu.


Ì huwo madu nke nēme ngwa n'ije-ozi-ya? n'iru ndi-eze ka o gēguzo onwe-ya; Ọ gaghi-eguzo onwe-ya n'iru ndi anāmaghi aha-ha.


na M'gētipia Asiria n'alam, ọ bu kwa n'elu ugwum nile ka M'gāzọ ya ukwu: yoke-ya gēsi kwa n'olu-ha wezuga onwe-ya, ibu-ya gēsi n'elu ubu-ha wezuga onwe-ya.


Chọnu Jehova, we di ndu; ka O we ghara ibia ike ike dika ọku n'ulo Josef, o we ripia, ọ gaghi-adi kwa onye nēmenyu ya nime Bet-el:


M'gēme kwa ka ulo Juda di ike, M'gāzọputa kwa ulo Josef, me ka ha lata, n'ihi na enwerem obi-ebere n'aru ha: ha gādi kwa ka agāsi na achupughm ha-ri: n'ihi na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, M'gāza kwa ha.


N'ihi na yoke nkem adighi-eb͕u nb͕u, ibum di kwa nfé.


M'gēsi aṅa, náním, bū ike-ọgwugwu-unu, na ibu-unu, na ise-okwu-unu?


Ha gēkè kwa ya òkè asa: Juda gēguzo n'ókè-ala-ya na Ndida, ulo Josef gēguzo kwa n'ókè-ala-ha n'Ugwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan