Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




1 Ndị Eze 11:27 - Bible Nso

27 Ma nka bu ihe kpatara o ji welie aka-ya megide eze: Solomon wuru Milo, mechie ntipú obodo Devid, bú nna-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Nke a bụ akụkọ banyere otu o siri bilie imegide eze: Solomọn wugharịrị Milo, wuziekwa ntipu dị na mgbidi obodo Devid bụ nna ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




1 Ndị Eze 11:27
12 Iomraidhean Croise  

Ọ bughi otú a ka okwu a di: kama otù nwoke nke sitere n'ugwu Efraim, Sheba nwa Bikri bu aha-ya, o weliri aka-ya imegide eze, bú imegide Devid: nyenum ya, nání ya, ka m'si n'obodo a la. Nwayi ahu we si Joab, Le, agātuputara gi isi-ya nime mb͕idi.


Devid we were ebe ewusiri ike nke Zaion; nke ahu bu obodo Devid.


Ma nka bu ihe kpatara usu ndi nēfè òfùfè nke eze, bú Solomon, weputara; iwu ulo Jehova, na ulo nke aka ya, na Milo, na mb͕idi Jerusalem, na Hezoa, na Megido, na Gezea.


Otú ọ di, nwa-nwayi Fero siri n'obodo Devid rigorue ulo-ya nke Solomon wuru nye ya: mb͕e ahu ka o wuru Milo.


Ndi-orù-ya we bilie, kekọta nkekọta-madu imegide ya, tib͕ue Joash n'ulo Milo, n'uzọ nke nāridaru Sila.


O rue na, mb͕e Sanbalat na Tobaia na ndi Arebia na ndi Amon na ndi Ashdod nuru na anāluzu mb͕idi Jerusalem nile, na amalitere ituchi ntipú-ya nile, iwe-ha we di ọku nke-uku;


I mewo ka ala ma jijiji; I b͕awawo ya: Mezie ntiwa-ya nile; n'ihi na o mewo nkpatu.


Ọ buru na i zuzuwo nzuzu n'ibuli onwe-gi, Ma-ọbu ọ buru na i zubewo nzube ọjọ, Tukwasi aka-gi n'ọnu-gi.


Nb͕awa nile nke obodo Devid ka unu hu-kwa-ra, na ha di ọtutu: unu wukọba-kwa-ra miri nke ọdọ-miri di n'okpuru.


Jehova, ebuliwo aka-Gi, ma ha adighi-ahu: ha gāhu ekworo I nēkworo ndi-Gi, ihere ewe me ha; ọzọ, ọku nke ndi nēmegide Gi gērichapu ha.


Unu arigoghi na ntipú, unu ab͕aghi kwa ogige nye ulo Israel, iguzo n'agha n'ubọchi Jehova.


N'ubọchi ahu ka M'gēguzobe ulo-ntu Devid ọtọ, bú nke dara ada, M'gēmechi kwa ntipú-ya nile; ọ bu kwa ebe-ya nile kwaturu akwatu ka M'gēguzobe ọtọ, wulie ya dika n'ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan